Onyeisiala Buharị ekeelela onyeisi NDLEA maka nnukwu ọgwụ ike ha nwuchiri

Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị ekeleela Buba Marwa bụ onyeisi ngalaba na-aluso ọgwụike ọgụ National Drug and Law Enforcement Agency (NDLEA) dịka ha jichiri ọgwụ ike ‘Cocaine’ ọnụego ya karịrị otu narị ijeri naịra na iri itoolu na atọ (N193B) na mpaghara Ikorodu, Legọs steeti.
Buhari onye nọ nzụkọ nke 77 otu United Nations General Assembly (UNGA77) ji ekwe ntị kpọọ Marwa iji gosipụta obi ụtọ ya.
O kwuru sị, "Obi dị m ụtọ maka ọrụ ị na-arụ imegide ọgwụike, ọ na-amasị m ị na-eso ọrụ ọma ị na-arụ".
A na-eche na nke a bụ njichị kachasị nke ha na-eme n’otu oge kemgbe ha malitere ọrụ.
Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru NDLEA bụ Femi Babafemi zipụtara n’ụbọchị 19 nke ọnwa Sepụtemba, 2022.
O kwuru na ha nwụchiri mmadụ anọ bụ ndị isi ibu ọgwụike a na mwakpo nke ha mere n’akụkụ Legọs dị iche iche nke gụnyere ụlọ ndịna.
Otu onye n’ime ndị a anwụchiri bụ onye mba Jamaica dịka NDLEA siri kwuo.
Ụmụnwoke anọ a ha nwụchiri dị n'agbata afọ 42 ruo afọ 69.

Ebe foto si, NDLEA
Babafemi kọwara na ha nyochapụtara ebe zoro ezo ndị a na-ezo ya bụ ọgwụ ike n’ime ụlọ a na-edobe ibu n’Ikorodu ahụ.
Ọ kọwara na ọgwụike niile a ha jichiri dị arụ karịa Kịlogram 1,855.
Ka ozi ya siri kọwakwaa, mwakpo a bụ nkata ha na ndị ọrụ nchekwa dị icheiche kpakọrọ ọnụ were mee nke gụnyere ụlọọrụ njichi ọgwụike mba Amerịka bụ American Drug Enforcement Administration.
Babafemi kwukwara na ha siri ime n’ala ruo abalị abụọ ma soro ndị a na nzuzo gaa akụkụ Legọs dị iche iche were nwụchie ha.
NDLEA nwụchikwara onye na-elekọta nnukwu ụlọ ahụ ebe ndị a na-ezo ya bụ ọgwụike.
Ozi ha kwukwara na ndị a anwụchiri so n’ime ndị na-ebu ọgwụike aga mba ofesi dị icheiche, bụ ndị ha na-achụgharị kemgbe afọ 2018.
Onyeisi ụlọọrụ NDLEA bụ Mohamed Buba Marwa toro ndị niile tinyere aka na nnwụchi a, ma dọọ ọha aka na ntị ọkachasị ndị na-ebu ọgwụike ka ha chee aka ghọrọ ndị ọrụ ha.
Nwụchi ọzọ gbara ọkpụrụkpụ NDLEA merela na nso nso a

Nwuchi Abba Kyari: NDLEA kpọpụtara aha Abba Kyari bụbụ Osote Kọmịshọna ndị uweojii Naịjirịa n'ọnwa Febụwarị 2022 dịka onye a na-achọ achọ.
Nke a bụ dịka ebubo na aka ya dị n'okwu ibu ọgwụike batara ha ntị.
Ha kwuru na a kpọrọ Kyari oku ka ọ zara ọnụ ya ugboro ugboro mana ọ bịaghị.
NDLEA kọwakwara na nnyocha ha gosiri na Kyari na ndị na-ebu ọgwụike nwere mmekọ, ma boo ya ebubo nrụrụaka.
E merechara nwụchịe ya na ndị uweojii mmadụ anọ ndị ọzọ nke gụnyere Sunday Ubuah, ASP Bawa James, ASP John Umoru (onye a na-achọ achọ), Inspr. Simon Agrigba na John Nuhu.
Ebubo ndị a mere ndị uweojii Naịjiria jiri kwụsị Kyari ọrụ nwa mgbe nta dịka okwu ka nọ n'ụlọikpe ruo ugbua.









