Abba Kyari FBI Indictment: Akwụsịla ya ọrụ n'ihi ebubo ịnara Hushpuppi akaazụ

AbbaKyari na Hushpuppi

Ebe foto si, AbbaKyari/Hushpuppi/Instagram

Nkọwa foto, AbbaKyari na Hushpuppi

Ngalaba 'Police Service Commission' (PSC) akwụsịla Abba Kyari ọrụ n'ihi ebubo ịna aka azụ n'aka Abass Ramon onye e ji Hushpuppi mara.

Nke a na-abịdị dịka Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba nyere ndụmọdụ ka a kwụsị nwa amadị ahụ ọrụ ruo oge e mechara nnyocha gbasara ebubo ahụ.

Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị PSC bụ Ikechukwu Ani kwuru na "nkwụsị ọrụ a kwụsịr Abba Kyari malitere n'ụbọchị Satọde, abalị iri atọ na otu nke ọnwa Julaị afọ 2021."

Cheta na onyeisi ndị uweojii bụ Alkali Baba degaara ngalaba Police Service Commission akwụkwọ n'ụbọchị 31 Julaị, 2021 ma gwa ha ka ha kwụsị Abba Kyari ọrụ.

Alkali Baba kwuru na nkwụsịtụ ọrụ a ọ na-ekwu ka akwụsị Kyari sonyere usoro ntaramahụhụ onye otu na-emeteghị ọfụma.

Ọgara n'ihu kwuo na ọ ga-enye aka ka otu ehibere ga-enyocha ya bụ ebubo e boro Kyari rụọ ọrụ ha ọfụma na-enweghị ihe mgbochi ọbụla .

Aha onyonyo, Etu nwoke akpọrọ "Nigeria's Supercop" ji ebuso ndị ntọ na ndi ojieegbe ezu ohi agha na Naịjirịa.

"Anyị anaghị akwụsịtụ ya ọrụ makana aka ya adịghị ọcha n'anya iwu ruo mgbe achọpụtara ihe ọbụla gosiri na o mere ihe a na-ebo ya."

Otu ga-enyocha ebubo Hushpuppi boro Abba Kyari bụ nke a akpọrọ Special Investigation Panel (SIP) na bekee.

Otu a gụnyere mmadụ anọ nọ na nnukwu ọkwa n'ụlọrụ ndị uweojii nke DIG Joseph Egbunike bụ Deputy Inspector General of Police in-charge of the Force Criminal Investigations Department (FCID) nọ n'isi ya.

Ihe otu Special Investigation Panel(SIP) ga-eme maka ebubo Kyari

  • Otu SIP ga-enyocha nke ukwu ebubo niile gọọmenti mba Amerịka boro DCP Abba Kyari dịka ha si depụta ya n'akwụkwọ ozi ha zitere ụlọọrụ Nigeria Police Force site n'aka ngalaba Federal Bureau of Investigation (FBI).
  • SIP ga-enweta ihe ndị zuuroke na-anochite anya Abba Kyari na ya bụ ebubo niile e boro ya, mee nyocha zuruoke maka ha ma nye ụlọrụ ndị uweojii ihe a nyochapụtara iji kwado ihe ndị ọzọ ngalaba ndị uweojii ka ga-eme maka okwu a.
  • IGP Usman Alkali Baba gara n'ihu kwuo na ngalaba ndị uweojii ga-ahụ na ihe niile gbasara okwu a ga-esonye usoro iwu tuziri nakwa a ga-akwanyere Kyari ugwu diri ya ruo mgbe e mechara nyocha ebubo e boro ya.

Cheta na ndị uweojii Naijirịa kwuburu na Jụlaị 29,2021 na ha ebidola nnyocha maka ebubo ngalaba nyocha mba Amerịka bụ 'Federal Bureau of Investigation' boro Abba Kyari nke kwuru na onye omekome ama ama bụ Ramon Abbas eji Hushpuppi mara kwuru na ọ nyere Kyari ego ruru otu nde dọla na ụma ka omekpaa otu onye ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: