Police Brutality: Etu ndị uweojii si kụpụ onye otu anyị mkpụrụ ọkwụrụ n'anya maka ọrụ ya

- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
Otu na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị a kpọrọ Women's Aid Collective (WACOL) ngalaba Enugwu na ndị otu ndị ọrụ ndị ọzọ na-ekwuchitere ọhaneze ọnụ ha mere ngagharịiwe maka agwa ọjọọ ha sị na ndị uweojii 'Area Command' kpasịrị ha.
Onyendu ha bụ Joy Ezeilo kọwara na otu nwagbọghọ ji anya mmiri gbata n'ụlọọrụ ha ma sị ka e nyere ya aka n'ihi otu nwaokoroọbịa dinara ya n'ike.
Nke a mere ndị WACOL ji buru mkpesa nwagbọghọ a gaa n'aka ndị uweojii site n'aka onye ọkaiwu ha bụ Goodness Ibangah.

Dịka a ka na-eme nyocha dị n'ime ya, nna nwaokoroọbia ahụ e chere na ọ kpara ego na ndị uweojii bidoro ịrịọ nwagbọghọ ahụ na ndị WACOL ka a kwụsị ikpe a.
Mana ndị WACOL gwara ha na ọ bụghị ha ka ọ dịrị ịkwụsị ikpe ahụ na-aga n'ihu.

Ezeilo kwuru n'ụbọchị 30 ọnwa Janụwarị, ndị uweojii mmadụ anọ bịara n'ụlọọrụ WACOL n'Enugwu, tie ọkaiwu Goodness Ibangah ọ nọ ndụ ọnwụ ka mma.
Ọ sị na ndị uwojii kpụkwara ya gaa n'ụlọọrụ ha nke 'Area Command' mgbe ha kụchara ya ihe.
Dịka ha hụrụ na nwaanyị a achọwala inwụ, ha ji ọsọ gaa dowe ya n'ụlọọgwụ 'National Orthopaedic' dị n'Enugwu.

Nke a mere ndị WACOL na ndị ogbo ha bụ otu Coalition of Eastern Non Governmental Organisations (CENGOS) jiri mee ngaghariiwe na gburugburu Enugwu megide ndị uweojii.
Ezeilo duru ndị otu ya gakwa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu bụ ebe ha nyere kọmishịọna ndị uweojii akwụkwọ mkpesa ha.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe sị na Kọmishịọna uweojii bụ Ahmad Abdulrahman ehiwela kọmitii ga enyocha etu ihe niile ji mee.
Ndukwe gwaara ndị WACOL ka ha ghara ịdị na ebuli okwu elu kama ka ha hapụ ndị uweojii ka ha rụọ ọrụ ha.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









