Odumodu Black: Etu oti egwu Igbo a si bụrụ onye ụwa ma ama n'ihi Declan Rice

Ebe foto si, Odumodublavck/Instagram
Dịka aha ọgba bọọlụ mba England bụ Declan Rice na-ewu ebe niile na soshal midia ugbua, aha otiegwu a kpọrọ Odumodublvck sokwa ya na-ewu.
Otu bọọlụ Arsenal nke England kwuputara taa bụ Satọde, Julaị 15, na Declan Rice esonyela n'otu bọọlụ ha, mana n'onyonyo ha ji mee nkwupụta a na Twitter, ha tinyere egwu nke Odumodu Black wepụtara n'afọ a, aha ya bụkwa Declan Rice.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'ime otu awa Arsenal ji wepụta ihe onyonyo ahụ n'akara Twitter ha, ndịmmadụ kiriri ya ihe karịrị ugboro nde 4.8.
Mana onye bụ Odumodu Black? Kedụ etu egwu ya si bụrụ ozurumba ọzụ nke na otu egwu bọọlụ a ma ama dịka Arsenal ji ya ekwupụta onye ọhụrụ ha zụrụ?
Chetakwa na Arsenal zụrị Rice site n'otu bọọlụ West Ham, n'ọnụahịa karịrị £105m nke bụ ọnụ ego kachasị otu ahụ na-azụta onye ọgba bọọlụ kamgbe e hibere ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Odumodu tipụtara egwu ọ kpọrọ 'Declan Rice' n'ọnwa Maachị 2023 iji gosi nkwado ya maka ọgba bọọlụ Declan Rice.
Egwu ahụ masịrị Declan Rice nke ukwuu maka na ọtụtụ ndị nkwado ya na-eji ya bụ egwu ajalite ya dịka ọ na-agba bọọlụ.
Ngwangwa Declan Rice mere ihe onyonyo ebe ọ na-agụ egwu ahụ, ọtụtụ mmadụna mba ụwa niile malitere ịchọ ya bụ egwu, nke mere ka aha Odumodu bụrụzie ihe ọtụtụ mmadụ na mba dị icheiche ma.
Onye bụ Odumodublvck?

Ebe foto si, Odumodublvck/Instagram
Ezigbo aha ya bụ Toochukwu Ojogwu.
Ọ bụ onye otiegwu na onye ode egwu.
A mụrụ ya na Legọs, mana nne na nna ya mechara kwafee n'Abuja bụ ebe ọ nọrọ gụọ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Christ The King College, Gwagwalada.
Ọ lọghachiri Legọs gụọ akwụkwọ Mahadum na Mahadum nke Legọs.
O sonyeere otu 'Native Records' n'afọ 2022.
'Declan Rice', egwu o tipụtara n'ọnwa Maachị 2023, bụ egwu ya kacha wuo ewuo.
Nke a bụ maka na Declan Rice n'onwe ya hụrụ egwu ahụ n'anya ma nyekwa aka kesaara ya mmadụ nde abụọ na ụma na-eso ya n'Instagram, nakwa mmadụ puku 572 na-eso ya na Twitter.
Declan Rice na Odumodu mechara zute onwe ha na London n'ọnwa June afọ a
Egwu ya ndị ọzọ Odumodu gụrụ gụnyere 'Picanto' nke ya na oti egwu ọzọ bụ Zlatan so gụọ.

Ebe foto si, Odumodublvck/Instagram
Mana ihe ọzọ mere aha Odumodublvck ji ewu na soshal midia bụ maka akụkọ kwuru na ụmụ akwụkwọ wakporo ya dịka ọ gara iti egwu na Mahadum Legọs Steeti













