Etu m si soro KCee mee egwu Ojapiano - Chigozie Okeke

Aha onyonyo, Etu m si sọrọ KCee mee egwu Ojapiano - Chigozie Okeke
Etu m si soro KCee mee egwu Ojapiano - Chigozie Okeke
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu and Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist

Oge Chigozie Okeke malitere ịfụ ọja dịka ọ dị afọ iri, ọ maghị na otu ụbọchị, ọ ga-abụ onye a ma ama na Naịjirịa.

Mana ọja ya emeela ka aha ya na-ada ụda, dịka o so otiegwu a ma ama bụ KCee tipụta egwu ọhụrụ a kpọrọ 'Ojapiano'.

Ojapiano bụ ngwakọ egwu nke sitere n'ịgwakọ ọja igbo na 'amapiano' nke bụ ụdị egwu si mba Saụt Afrịka.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Chigozie, onye ka bụkwa onye ntorobịa na-eto eto, kwuru na ọ bụ na nrọ ka e nyere ya ọja oge ọ ka bụ nwata.

O mechara were ego nne ya nyere ya n'oge ekeresimesi gote ọja n'ahịa ma malite igbu ọja.

Ọ kọwara etu ya si gbuo ọja n'otu ebe a na-eme mme, otiegwu KCee, onye ezigbo aha ya bụ Kingsley Okonkwo, wee hụ ya ebe ahụ ma kpọrọ ya ka ha abụọ soro tipụta egwu.

Chigozie kwuru na ya nwere olileanya na ọja a ọ na-egbu ga-ebuga ya mba ụwa niile.

Kirie akụkọ a n'uju n'onyonyo dị n'elu.

Chigozie Okeke