Kcee Limpopo: "Mmegbu a na-emegbu ndị Igbo akarịala"

KCee

Kingsley Chinweike Okonkwo, onye otiegwu a ma ama e ji 'Kcee Limpopo' mara ebekuola ndị Igbo ka onye ọbụla chekwa nwanne ya.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a dịka tigbuo zogbuo na-akpọtụ n'Ọwụwa Anyanwụ.

Kcee kwuru na ọ bụ eziokwu na a na-emegbu ndị mana na imebi ala Igbo agaghị enyere ndị Igbo aka n'ihi na onye ebighi n'ala Igbo nwere ndị bi na ya ọgbaghara nwere ike imetụta.

"Dịka nwafọ m bụ, ala Igbo adịghịzị ka ọ dị mbụ, ọgbaghara dị ebe niile ugbua, achọghị m ịkpọ aha."

"Anyị kwesiri ịchịkọta onwe anyị ọnụ kwụrụ otu ebe, nwee nkwekọrịta n'otu ihe, nwekwa otu olu wee mezie ala anyị."

Kcee kwuru, "Ka anyị nọrọ n'udo ka anyị si nọrọ n'oge mbụ dịka ndị Igbo, nwee otu obi na otu olu.

KCee

"Onye ọbụla chebe nwanne ya, agbanyeghị steeti isi maọbụ Imo, maọbụ Abia... Anyị niile bụ otu"

"Ka anyị ghara iji aka anyị tisaa ihe Chukwu nyere anyị dịka Ọ gọzịrị anyị n'ụzọ pụrụịche."

"Mmadụ niile chekọta nwanne ya, ka anyị nọrọ nke ọma."

Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:

'Ala Igbo dị mma, ọ bụ maka ọ dị mma anyị nịịle'

KCee

Kcee kwuru na ihe mee "Ala Igbo dị mma, ọ bụ maka ọ dị mma anyị nịịle".

"Etu a m bi na Legọs, e nwere m ụmụnne, ikwu na ibe bi n'ala Igbo, ihe ọbụla mebiri ebe ahụ ga-emetụta m"

"Dịka ọtụtụ ndị be anyị na-achọ nnwereonwe, i lee anya i ga-ahụ na mmegbu ndị Igbo ka nkụ n'ezie ka m kwuo eziokwu."

"Ị gaghị eti nwata ihe sị ya hapụ ibe akwa. Agbanyeghi ihe ndị a ọ ka mma na anyị ji otu obi na otu olu mezie be anyị tupu ala Naijịrịa anụ ihe anyị na-ekwu."

Ka o si banyere n'iti egwu.

Kcee kwuru na egwu bọọlụ bụ ihe ọ chọburu ime mgbe ọ dị na nwata mana ịgụ egwu bụ ihe nọ na-amasị mgbe ahụ.

O kwuru na mgbe ya na ndị otu ya ritere mmeri n'asọmpị ịgụ egwu 'Star Quest' bụ mgbe kpakpa ndọ ya ji chekee.

Ị lụọla nwaanyị?

KCee Limpopo

Ebe foto si, Kcee /Instagram

N'okwu alụmddinanwunye, Kcee kwuru na ya na nwụnye alụọla kemgbe afọ 11.

Kcee, onye kwuru na ha bi n'udo na ọṅụ, kwukwara na ha ji ụmụ atọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na mgbe mbido alụmdịnanwuye ha, na ọ gbara mbọ zoo nwụnye ya maka ọ chọghị ka ndị mmadụ bata mebiere ya ihe ọ hụrụ anya nke ukwuu.

Kcee na E-Money

KCee na E-Money

Kcee sị na o nwere ụmụnne asatọ, na ọ bụ nwanne ya bụ 'E-Money' bụ nke ọha ma maka na ọ bụ onye na-egosi onwe ya n'ihu ọha.

Ọ sị na ọ tọrọ otu nwaanyị bụ onye tọtara E-Money ezi aha ya bụ Emeka Okonkwo. Ọ gakwara n'ihu kwuo ihe mere ọ naghị egosi ndị be ha.

N'okwu ya, o si: "Mgbe m gosiri foto nne m, ndị mmadụ nyochapụtara ya chọrọ itọrọ ya mana otu onye n'ime ha bịara kpọọ n'ekwentị gbara m ama atụmatụ a"