KCee Limpopo: Etu m si kpọpụta otu nwa okorọbia n'ụbịam

KC Limpopo
Nkọwa foto, KC Limpopo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otiegwu a ma ama bụ Kingsley Chinweike Okonkwo eji Kaycee Limpopo mara akọọrọla BBC Igbo akụko ntị anụbeghi mbụ.

Akụkọ ahụ metụtara etu ya na nwanne ya nwoke bụ Emeka Okonkwo maọbụ E-money siri gbanwee ndụ otu okorobịa nọ n'ụbịam.

Kaycee bụ onye Uli n'Anambra steeti kọrọ akụkọ ahụ n'uju mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka na Facebook.

Kaycee kwuru na mgbe o si ọrụ otiegwu ya lọta na mba Amerịka, o zoro onwe ya banye okporụzọ ire ahịa "recharge card".

Ọ bụ ebe ahụ ka o zutere otu nwoke, onye Ebonyi steeti bụ onye kọọrọ ya etu ya na ezinaụlọ ya si ata ahụhụ.

KC gara n'ihu kwuo sị: "Mgbe o ruru ụbọchị ncheta ọmụmụ E-money, ọ gwara m na Chineke tinyere ya n'obi ịnyere mmadụ aka, m were kọọro ya maka nwoke Ebonyi ahụ, ọ sị m chọta ya."

"Mgbe m gara ịchọ ya bụ nwoke o were bụrụ na ndị gọọmentị anwụchiela ya maka ịre ihe n'okporoụzọ."

"Agbapụtara m ya na mmadụ asatọ ndị ọzọ ma kpọrọ ya laa n'ụlọ m bunye ya ụgbọala ọhụrụ nakwa naịra puku narị atọ."

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ọ sị na kemgbe ahụ, nwa okorobịa ahụ agbanweela ndụ ya nke ọma.

Ọ kọwara na nwata nwoke ahụ rere ụgbọala ahụ jiri ego ya gbapee ụlọahịa abụọ ebe ọ na-ere akwa ma na-arụkwa ọrụ n'ụlọọrụ ya na E-money nwanne ya nwoke.

Kaycee kwuputara obi ụtọ ya maka etu nwa okorobịa ahụ siri gbanwee ndụ ya sị "ọ bụghị mmadụ niile ị nyere ụdịrị ohere ahụ ga-eji ya mee ihe nwere isi."

O kwukwara na anyammiri gbara ya mgbe nwoke ahụ bịara gwa ya na ọ dịla njikere ịlụ nwaanyị n'ihi na ọ hụrụ mgbanwe enyemaka ya butere na ndụ onye ọzọ.

Na ngwụcha, o kwuru na ndụ nwoke ahụ na-akpalite mmuọ ya na nwanne ya nwoke bụ E-money inyere ọtụtụ ndị ọzọ aka.

"Enyemaka abụghị ihe a na-eme maka otuto ọha mmadụ" ka o kwuru.