Kelechi Arsenal: Dịka onye nkwado Arsenal, nwaanyị ọbụla agaghị emewali gị obi

Aha onyonyo, Kelechi Arsenal

Otu bọọlụ Arsenal nke mba England so n'otu bọọlụ a kacha anụ ha anụ na mba ụwa niile.

Mana n'afọ ole ma ole n'ọdị nso a, ya bụ otu bọọlụ anaghị emecha ọfụma etu ndị nkwado ha si atụ anya.

Kelechi Anyikude bụ onye nkwado ndị otu bọọlụ Arsenal a ma ama n'ụwa niile dịka Kelechi Arsenal.

O kwuru na dịka onye nkwado Arsenal, onweghịzi ihe nwereike imewa ya obi, "maka na Arsenal emewaala m obi ugboro ugboro, mana enweghị m ike ịhapụ ha."

Ihe e ji mara nwa amadi a bụ maka otu o si eke ekike ma ọ na-aga ikiri asọmpi ndị Arsenal.

Kelechi Arsenal na-eke ekike e ji mara ndị Igbo oge niile iji kọwaara ndị ọcha na omenala Afrịka amaka.

Kelechi Anyikude na Arsene Wenger

Ebe foto si, KelechiAFC/Instagram

Nkọwa foto, Kelechi na Arsene Wenger bụbu onye nkuzi ndị Arsenal

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a, o kwuru na etu a o si eke ekike emegheerela ya ọtụtụ ụzọ.

"Ezenwaanyị England eziterela m ozi ma gwa m ka m bịa n'obi ya," Kelechi kwuru.

"Mụ na ọtụtụ ndị a ma ama ezutekwala n'ihi ya."

"Nke a bụ ụzọ m si egosipụta ihe ọma dị icheiche dị n'omenala Igbo nakwa ụzọ ndụ ndị Afrịka."

Olileanya m maka otu Arsenal n'afọ a

Kelechi Anyikude na Mikel Arteta

Ebe foto si, KelechiAFC/Instagram

Nkọwa foto, Kelechi na Mikel Arteta bụ onye nkuzi bọọlụ ndị Arsenal

Kamgbe afọ 2006, Arsenal esonyebeghị n'asọmpi 'Uefa Champions League', nke bụ asọmpi otu bọọlụ ndị nwere agba na mpaghara Europe niile.

Ọ bụ ndị nọ n'ogogo mbụ ruo ogogo anọ n'asọmpi bọọlụ nke England na-etozu isonye na UCL.

Mana Kelechi kwuru na o nwere olileanya na Arsenal ga-etozu isonye na UCL n'afọ a.

Ka ọ dị ugbua, otu Tottenham bụ ndị nke anọ na tebulu EPL ebe Arsenal bụ ndị nke ise.

Onye bụ Kelechi Arsenal?

Kelechi Anyikude

Ebe foto si, KelechiAFC/Instagram

  • Ezigbo aha ya bụ Kelechi Anyikude
  • Ọ bụ onye Nkwere n'Imo Steeti
  • O nwere nzere PhD na ngalaba agụmakwụkwọ a kpọrọ 'Environmental Engineering'
  • O bi na London nke mba England
  • Ọ lụbeghi nwaanyị