Brighton vs Arsenal: A pịawaala Arsenal ogbe azụ

Brighton na Arsenal

Ebe foto si, European Photopress Agency

Ndị Arsenal hụrụ nwịị n'aka Brighton dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie ha.

Ndị Brighton nabatara Arsenal n'azụ ụlọ ha, pịa ha ụtalị mmụọ iji gosi ha na ha abịaghị ịchị.

Neal Maupay nyere goolu abụọ ndị Brighton na nkeji 90 na ụma, iji kpọnye ntụ n'akpati Arsenal, n'ihe bụ mmeri nke abụọ a na-emeri ha kemgbe a malitekwara Premier League ọzọ.

Nicolas Pepe nke Arsenal bu ụzọ nye goolu na nkeji 68, mana Lewis Dunk bịara saa ya na nkeji 75.

E bupukwara Bernd Leno bụ Che goolu nke Arsenal, mere ya onye nke atọ (gụnyere Granit Xhaka na Pablo Mari) na-emerụ ahụ kemgbe Arsenal lọghachitere imalite asọmpi Premier League.

Cheta na Brighton merikwara Arsenal mgbe ha zutere n'ụkwụ nke mbụ.

Akụkọ ga-amasị gị