Arsenal vs Manchester United: 'Pepe' ndị Arsenal agbaala Manchester United ose n'anya n'afọ ọhụrụ

Ebe foto si, Reuters
Ọbịbịa Mikel Arteta dịka onye nkuzi ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal amalitela ịmịta mkpụrụ.
Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Manchester United n'abalị Wenezde.
Nke a bụ mmeri mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ n'Arsenal.
Pepe nyere goolu nke mbụ ka ọ gachara nkeji asatọ ya bụ asọmpi malitere.
Ka ọ gachara nkeji 42, Sokratis Papastathopoulos nyere goolu nke abụọ.
Nke a bụ mmeri nke mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ dịka onye nkuzi ndị Arsenal.
Mmeri a mere ka Arsenal gbagote n'ọnọdụ ndị nke iri na tebulu 'English Premier League'.
Pepe, bụ onye Arsenal ji nde paụnd 72 zụta n'ọnwa Ọgọst ritere nzere ọkacha agba na ya bụ asọmpi.
Ọ bụghị naanị na Pepe nyere goolụ na asọmpi a, ọ gbakwara bọọlụ kụrụ n'igwe.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










