Ibidunni Ighodalo: Lee etu akwamozu ya si aga ugbua

Ebe foto si, Instagram/Ibidunni_Ighodalo
Ka otu izu ọ nwụrụ gachara, ezinaụlọ Ibidunni Ighodalo agbakọọla maka akwamozu na olili ya.
Ụfọdụ ndị ụlọụka ya na di ya bụ Trinity House, so ezinaụlọ ya gbakọọ ịgwa ya okwu ikpeazụ tupu e lie ya.
Lee ka ya bụ emume si aga ebe a:
Mara na a e mere emume ịmụanya abalị akwamozu n'ụbọchị 18 nke ọnwa Juun a.
Onye ose foto ama ama bụ TY Bello (Toyin Sokefum-Bello) gosipụtara site n'akara Instagram ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Bello bụ enyi ya wepụtara ebumnobi ikpeazụ Ibidunni Ighodalo degara ya n'ozi nkata ha nwere tupu ọ nwụọ.

TY Bello were foto mparịtaụka ahụ Ighodalo degara ya tinye na instagram ya, nke mere ka ndị mmadụ gosiwe nwute ukwu maka ọnwụ ya.
Ighodalo dere si na ọ ga-agba afọ iri anọ n'ọnwa Julai na-abianụ, mana ihe kachasị ya mkpa bụ ime ka ezinụlọ iri anọ na-achọ nwa kuru nwa ha n'aka.
O dere na ọ chọghị oriri na nkwa so ncheta ụbọchị ọmụmụ ya kama ka ezinụlọ iri anọ nwebe aṅụrị.

Ebe foto si, TY Bello Instagram
Ndị mmadụ ka na-aga bee Ibidunni Ituah-Ighodalo bụ nwunye ụkọchukwu Ituah Ighodalo nwụrụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Junu, iti ndị bee ya aka n'obi.
Ndị ntaakụkọ BBC gara bee ya dị n'Ikoyi were setee foto ka ebe ahụ dị n'ụtụtụ a.
Ha hụkwara na e dowere akwụkwọ nkwanye ugwu ikpeazu ebe ndị mmadụ na-edebanye aha na bee Ibidun nwụrụ anwụ.

Ihe iribama o mere mgbe ọ nụrụ maka ọnwụ nwunye ya

Ebe foto si, Ituah Ighodalo Facebook Page
Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia eto di Ibidunni Ituah-Ighodalo bụ nwaanyị nwụrụ ụnyahụ bụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Junu.
Ha na-ekwu na agbanyeghị na nwoke ahụ nụchara maka ọnwụ nwunye ya, ọ gara ebe akpọrọ ya ka ọ bịa ka ụka akwamozu ụbọchị ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Ibidunni Ituah-Ighodalo bụ nwaanyị turu ugo dịka onye kachasị maa mma, bụ nwunye ụkọchukwu Ituah Ighodalo, nwụrụ ụnyahụ bụ ụbọchị iri na anọ nke Junu.
Ighodalo nke di ya bụ ụkọchukwu nwe ụlọụka Trinity House dị na Legọs, nọ na-akwado ime ncheta ọmụmụ ya n'ọnwa Julaị, tupu ọ nwụọ.
Lawal Nurudeen bụ onye na-elekọta ụlọọrụ Ibidun bụ Elizabeth R, kwuru na Ibidunni nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Juun, n'ụlọoriri na nkwari dị na Pọtakọt, Rivas steeti, ebe ha gara ọrụ ndozi.
N'okwu Lawal gwara BBC, o kwuru sị "Ihe m ma bụ na ọ labara ụra n'abalị ụnyaahụ mana o tetaghị ọzọ n'ụtụtụ a".

Ebe foto si, Ibidunni Ituah-ighodalo Facebook page
Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ihe e ji echeta ya bụ na ọ mụtaghị nwa ka o mechara In vitro fertilisation (IVF) ruru iri na otu (IVF bụ usoro sayesnsị si enyere nwaanyị aka ịtụta ime), mana o kutere ụmụ abuọ ya na di ya na-elekọta.

Ebe foto si, Ibidunni Ituah-ighodalo
Ibidunni bụ onye ojiegoachụego nakwa onye na-adụ ndị mmadụ ọdụ gbasara alụmdinanwunye, hibere ụlọ enyemaka n'efu na-enyere ezinaụlọ ndị na-achọ nwa aka.
Ya na di ya gbara akwụkwọ afọ 13 gara aga.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya:
Ọnwụ ya akpalitela okwu na soshal midia, ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ezigbo mmadụ nwere obi ọma.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

End of X post, 4

End of X post, 5

End of X post, 6

End of X post, 7