Arsenal vs Chelsea: Egbe Arsenal agbakasiala Chelsea isi rie ha ka anụ Sallah

Ebe foto si, Getty Images
Chelsea na Arsenal gwọrọ onwe ha ịba taa n'asọmpi iko FA n'ọgbọegwu nke Wembley dịka Arsenal gbagoro ya ugboro iri na atọ (13) ya, Chelsea nke ugboro itoolu (9).
Ya bụ egwuregwu malitere n'ike na ebube dịka Chelsea nyere goolu mbụ ha na nkeji nke ise site n'aka Pulisic.
Ọ dịka ya ha bụ oke iyi riru Pierre-Emerick Aubameyang nke bụ na ahụghị ụkwụ egwu ya anya n'ime nkeji iri abụọ n'isi amalitere bọọlụ ahụ.
Mana chi Arsenal zara ha oku dịka e nyere ha penariti na nkeji iri abụọ na isii bụ nke Aubameyang nyere, mere ya bụ egwu jiri kwụrụ na 1-1.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ dịka Aubameyang o ji aghụghọ ghọta penariti ahụ maka na ahụ ya na nwoke ahụ emetuchaghị.
Mana Chi ya zara ya ekpere.
Ya bụ goolu mere ka Arsenal Kelie mezia ka Chelsea daa mba nwamgbe nta.
Mana mgbe abatara ezumike, Chelsea lọghachitere n'egwu.
Na nkeji nke iri anọ na itoolu Christain Pulisic meruru ahụ nke mere ejiri were Pedro gbawee ya.
Aubameyang zakwara aha ya ụzọ na nkeji iri isii na asaa site n'itinye goolu ọzọ nke mere ya Arsenal 2 - 1 Chelsea.
Ọkpa Aubameyang dị ọkụ na mgbe a.
Ọnwụ ndị Arsenal gburu ka arụrụ aka na nkeji iri asaa na anọ mgbe Mateo Kovacic nke Chelsea gbatara 'red card' site na 'yellow' abụọ ọ nwetere.
Mgbe ahụ, Chelsea ji mmadụ iri agba, Arsenal nwere mmadụ iri na otu.









