Hull City v Chelsea: Chelsea emechiela akwụkwọ n'iko FA

Ebe foto si, Getty Images
Chelsea mere ihe a tụrụ anya n'aka ha n'asọmpị iko FA dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie otu Hull City mgbe ha zutere onwe ha.
Michy Batshuayi bụ ụzọ meghe ụzọ goolu dịka o nyere nke ya na nkeji 6 n'agba nke mbụ.
Fikayo Tomoro bụ ọgba bọolụ Naịjirịa nyekwara ya aka na nkeji 64 mgbe o nyere ọkpụ mere ya nke abụọ.
Kamil Groscki nke Hull City nwara ịhichapụ ihere n'ihu otu ya na nkeji 78 mgbe ọ gbahyere ọkpụ na neeti ndị Chelsea.
Chelsea mechara buru ndị mmeri dịka asọmpị ahụ bịara na njedebe.
Inec emegharịala ntuliaka na steeti iri na otu taa

Ebe foto si, @InecNigeria/Twitter
Ngalaba na-achịkọta ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC amalitela imegharị ntuliaka na Abia Imo Kaduna Ogun na steeti asatọ ndị ọzọ.
Steeti ndị a bụ Imo, Abia, Cross River, Akwa Ibom, Kaduna, Bauchi, Niger, Kano, Sokoto, Benue nakwa Ogun steeti.
Ọkwa ndị ntụliaka mmegharị metụtara gụnyere onyeisi okpuruọchịchị, ọkwa ụloomeiwu ukwu nakwa ụlọomeiwu steeti.
Anyị nụrụ kepu kepu na ọgbaghara dapụtara n'ụfọdụ ebe mana onwebeghị ihe akaebe gosiri na ọ bụ eziokwu.
Ozuola bụ na ozuola!
N'aka ọzọ ndị obodo Sabon Tasha na Juji dị na Kaduna steeti emeela ngagharịiwe maka ntọ atọrọ otu nwaanyị na ụmụ ya abụọ na mpaghara ahụ
Ụlọntaakụkọ Channels kọwara na ndị uweojii ekwubeghi ma ihe a mere n'ezie ebe mana ndị obodo ahụ gara ihu gbochie okporoụzọ ebe ụgbọala si agbafe
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mba Chaịna na-eme emume afọ ọhụrụ ha nke 2020 ha kpọrọ "Afọ Oke".
Nkwenye ha bụ na dịka oke si a mụ ọtụtụ ụmụ, ngozi ha n'afọ a ga-adịkwa ọtụtụ ka ụmụ oke.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Reuters
Kelechi Iheanacho ejirila otu ọkpụ goolu zọọ ndụ otu Leicester City ma kwanye ha n'agba nke ise n'Asọmpị FA Cup.
Nke a mere ka aha ya malite iwu n'elu soshal midia dịka ndị mmadụ na-ebunye ya ụkpa ekele maka ihe o mere.
Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a
Ndị ọrụ ahụ ike niile meturu nwaanyị bu ọrịa Lassa aka agaala ezumike mgbochi?

Dịka ndị ụlọ ọrụ Parklane Enugwu na-eme nyocha ndị ọrụ ahụ ike ha niile metụrụ nwaanyị ịba Lassa gburu aka n'Enugwu, kepu kepu na-eru anyị ntị bụ na ha amanyela ndị niile metụrụ ya aka ka ha gas ezumike mkpụrụ ụbọchị 21.
Otu onye dọkinta so na ndị iwu a metụtara gwara BBC Igbo na ha niile na aṅụzị ọgwụ mgbochi ọya bụ Post Exposure Prophylaxis n'olu bekee iji were gbochie ha ịnweta ya bụ nje Lassa Fever.
Okwuru na ụbọchị iri abụọ na out gachazia, ha niile bụ ndị gaara ezumike mmanye ahụ nwezịrị ike bido ọrụ ha n'ihi na oge ahụ ka ọ ga edo anya na ha ebughi ya bu ọrịa Lassa fever.
Dokinta ahụ na-ekweghị ka akpọọ aha ya kwuru na obi anaghị akụ ya n'ihi na onwere oluleanya na onwegji onye bu ya bụ ọrịa.
Mgbe BBC rutere na Park Lane Enugwu, ọgwụ mgochi ahụ a na-agba na gburu gburu ụlọ ọgwụ ahụ abịala na njedebe ebe ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ malitekwara n'uju ọzọ.
Onweghi onye na-ekwuru ụlọ ọgwụ kwere itinye ọnụ n'atụmatụ a.
Akụkọ ka na-abịa.
N'okwu nje kwa, ọnụọgụ mmadu ọrịa Coronavirus gbugoru agafeela iri na isena mba Chaina dika ya bu nje na agbasa na mba ahụ nakwa mba ụwa.
France, Briten, Australia, Amerịka, Thaịland, Singapore, Nepal, Japan, Vietnam, Taiwan na South Koria so na mba nwere ndi ofesara.
Ejila aka gị goo igwe ọkụ ọha - NERC

Ebe foto si, AFP
Ngalaba na-ahụ maka okwu ọkụ latrịk bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (Nerc) ekwuola hoo haa na onye ọbụla ndị na-enye ọkụ latrịk bịara sị ya weta ego weta transformer gbara bịa gwa ha.
Ha sị na nke abụ makana ọbụghị onye na-ego ọku ka ọdịrị igota ihe ndị a.
N'egwuregwu,

Minista na-ahụ maka egwuregwu na mba Briten bụ Nigel Adams na-ekwusiike na aka ụlọ ọrụ chaa chaa akarịala na asọmpị bọọlụ.
Nke na-abịa ka ndị mmadụ gbarụrụ ihu na eresiri ụfọdụ ụlọ ọrụ chaa chaa ikike igosi asọmpị bọọlụ n'intaneti.









