Ihe ị kwesiri ịma maka Unai Emery

Ebe foto si, Getty Images
Arsenal ekwuola onye nchịkọta ha ọhụrụ bụ Unai Emery.
Unai kwuru na obi dị ya ụtọ maka ọrụ ọhụrụ a Arsenal nyere ha.
Otu n'ime ndị onyeisi Arsenal bụ Ivan Gazidis kwuru na Emery bụ onye onyeọbụla chọrọ ga-abụ onye ga-anọchite anya Arsene Wenger.
Emery dị afọ iri anọ ji afọ iri abụọ na abụọ chiburu otu PSG tupu ọ gawa Arsenal.
Onye bụ Unai Emery?

Ebe foto si, AFP
Emery nwere mmerị ọtụtụ oge na asọmpị nke mpaghara France na kwa buru iko anọ na asọmpị a.
Emery bụkwa onye nchekọta ndị otu Sevilla oge a buru iko Europa League ugboro atọ.
Ọ bụ onye gbagburu bọọlụ n'ime otu Real Sociedad na Leganes tupu ọ bịdọ ọrụ nchịkọta ya n'afọ 2004.
Emery abụọla onye nchịkọta otu dị iche iche dịka Valencia, Sevilla, Spartak Moscow na PSG.
'Ọrụa atọọgboola m'

Ebe foto si, AFP
Unai Emery kwuru na ya anaghị akwatu obi ndị na-etiri Arsenal mkpu.
O kwukwara na ya ga-eme ihe Wenger enweghị ike ime, ya-abụ ị meri iko Champions League.
Ndị ọzọ Arsenal nyochara maka ọrụ a bụ Patrick Vieira, Thierry Henry, Mikel Arteta, na onye bụbụ onye nchịkọta otu Barcelona coach bụ Luis Enrique na onye nchịkọta Juventus' Massimiliano Allegri.









