Arsenal vs Man City: Man City achụghachịla Arsenal na 'lockdown'

Sterling

Ebe foto si, EPA

Goolu Raheem Sterling nyerela Man City zuru iji kpọpee ọnụ ụzọ ka mmiri zobata.

Goolu a e nyere na nkeji 45 n'ọkara nke mbụ, mere ya mbụ a na-enye n'asọmpi Premier League dịka a na-amalite ya bụ asọmpi ka ụbọchị 100 e ji kwụsịtụ ya n'ihi mkpamkpa coronavirus gachara.

Kevin de Bruyne ji penariti nye goolu nke abụọ na nkeji 51, dịka David Luiz - e webatara nwa obere oge tupu ọkara nke mbụ agwụ - ji aka dọtuo Riyadh Mahrez.

A chụpụrụ Luiz n'agbanyeghi na ndị otu ya na-aba mba na-aba mba na-asị na enweghi ihe o mere.

Na nkeji 90 na ụma a ga-eji egbuchi bọọlụ, Phil Foden nke Man City emezuo ya atọ site na bọọlụ Sergio Aguero chọrọ mma, iji tinye Arsenal na ndị na-akwado ha n'obi mgbu.

Mara na Man City mechara fọ naanị mmadụ 10 n'ọgbọegwuregwu oge Eric Garcia pụrụ, nke a mere n'ihi na ha agbanwechaala mmadụ ole ha nwere ike.

A tụkwasịkwuru nkeji 12 n'elu nkeji 90 e ji gbaa bọọlụ a n'ihi ọtụtụ mmerụ ahụ na oge e gburu n'ịṅụ mmiri n'ihi mkpomọkụ dị ebe ahụ.

Arsenal gara njem n'ọgbọegwuregwu Etihad bụ be ndị Manchester City, ebe ha gbara egwu onye ike ga-agwụ, mana Man City tiri ha mmọnwụ.

N'ime nkeji 25 e ji bido bọọlụ, mmadụ abụọ na-agbara Arsenal - Granit Xhaka na Pablo Mari Villar - pụkwara site na mmerụ ahụ.

Ọ bụrụ na Arsenal meriri Man City, Liverpool ji pọịntị 25 aga City, gaara emeri ma bụrụ ndị butere iko Premier League nke afọ 2020 a. Mana oge ka dị.

Ka ọ dị ugbua, Arsenal ga-ezute Brighton n'egwuregwu ọzọ ha ga-agba.