Anaghị m ahụ ụzọ, mana ọ gbochighị m ịbụ onye na-azụ ezi - Ozo Augustine
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara na Kelechi Anozia
- Ndị mere akụkọ a, Reporter na Video Editor
Na mpaghara Afrịka dị icheiche, inwe ọrụsị na-abụkarị ihe mwetu ala nye onye ọbụla nwere ya.
Ọtụtụ ndị nwere ọrụsị na-abụ ndị na-arịọ arịrịọ maọbụ dabere n'enyemaka nke ndị agbatobi ya iji bie ezi ndụ.
Mana Ozo Augustine Nnamdi, onye kpuru isi kamgbe ọ dị afọ 15, jụrụ ajụ na ya agaghị abụ onye arịrịọ, kama ọ ga-eji aka ya na-emepụta ihe iji nyere ndụ ya aka.
Ozo Augustine bụ onye na-azụ anụmanụ. Ezi bụ anụmanụ nke ọ na-azụ.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Augustine kwuru na mmadụ inwe ọrụsị abụghị ọrịa, nke mere na ọ bụghị ihe kwesịrị ekwesị mmadụ ịbụ onye arịrịọ n'ihi ọrụsị mmadụ nwere.
O kwuru na ya họọrọ ịzụ ezi n'ihi na ọ bụ ya ga-aka dịrị ya mfe ijikwata, ọzọkwa bụ na ezi na-amụ ọtụtụ ụmụ, nke mere na ọ na-enye ọmụrụ nwa.
"Azụgo m oke oyibo (Rabbit), zụọ ọkụkọ, tupu m malite ịzụ ezi, mana a chọpụtara m na ịzụ ezi ka mma," ka Augustine kwuru.

Augustine kwuru na nsogbu anya ya malitere oge ọ bụ nwata, dịka a gbachara ya ọgwụ mgbochi ọrịa.
"Ya bụ ihe bu ụzọ metụta otu anya m, m were otu anya na-ahụtụ ụzọ obere, mana ka oge na-aga, anya nke ọzọ kwụsịkwara ịhụ ụzọ," Augustine kwuru.
Mana otu nwanne nna ya kpọgara ya n'ebe a na-enye ndị kpuru isi ọzụzụ na mpaghara Oji River nke Enugwu steeti, bụ ebe ọ nọrọ gụọ akwụkwọ.
Nwa amadi a kọrọ akụkọ etu ụfọdụ ndị mmadụ si akpaso ya oke n'ihi na ọ naghị ahụ ụzọ. Otu oge bụ mgbe ọ chọtara ụlọ ebe ọ ga-ebi, mana onye nwe ụlọ ahụ ekweghị enye ya ụlọ n'ihi na ọ bụ onye kpuru isi.
Augustine kwuru na olileanya ya bụ ịkwalite ọrụ ya dịka onye na-azụ anụmanụ, ma nwee ike ịzụlite ndị ọzọ.
Gere akụkọ a n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.








