Stevens-Johnson syndrome: Ọgwụ mebiri emebi kpuru m isi - Odunze Vivian
Odunze Vivian ji mkpụrụanya ya abụọ ahụ ụzọ oge ọ pụtara ụwa.
Mana ọ bụ oge ọ dị na nwata ka ọ ṅụrụ ọgwụ mebiri emebi nke buteere ya ikpu isi.
Oteghị aka nke a mechara, nna ya hapụrụ ya na nne ya lụọ nwaanyị ọzọ.
N'agbanyeghị ihe ndị a, Odunze Vivian ṅụrụ iyi na ọ ga-agụrịrị akwụkwọ.
Chineke zara ya ekpere site n'enyemaka ndị mmadụ nakwa nke 'Bethesda School for the Blind'.
Ugbua, Odunze Vivian bụ nwata akwụkwọ na mahadum 'University of Lagos', ma bụrụkwa onye nkuzi na 'Bethesda School for the Blind'.
Ndị mere ya Gift Andrew Odinakachi na Dan Ikpoyi rụpụtara ya.
Gere akụkọ ya n'uju.




