Spinal Muscular Atrophy: Oluebube mere mgbe anyị na-amụpụta nwa Agaezi- Dọkịta

Aha onyonyo, Agaezichihogeme Joy: ‘Amaghị m na nwoke nwereike ile m anya n’ihu ma ya fọrọ ituwa m ime'

Dọkịta Emmanuel Chukwuka na-arụ n'ụlọgwụ Odumegwu Ojuwku University Teaching Hospital akọwala udiri ọlụebube mere mgbe Agaezichukwu Joy nwere nkwaru 'Spinal Muscular Atrophy' mụrụ nwa n'ụlọgwụ ha.

O kwuru na kamgbe o bidoro rụwa ọrụ dibia bekee, ọ hụtụbeghị udiri a.

O kwuru na otu ihe gbara ha ume nke ukwu bụ etu Agaezi si were obi ụtọ na ụmeala buo afọ ime ma nabata mkpebi ha na a ga-eji iwa afọ kupute nwa ya nwoke.

O kwuru na ihe niile gara nkeọma karịa etu ya ndị otu ya si chee.

Amaghị m na nwoke nwereike ile m anya n'ihu ma ya fọdụzie ịtụ ime - Oliver Joy

Nwada Agaezichihogeme Oliver Joy nwere nkwarụ kọwara etu ya na ọyị ya nwoke si zute nke o jiri tụwa ya ime nakwa etu o si mụọrọ ya nwa.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Oliver Joy dị afọ iri atọ sị na ọ na nwoke nwereike ile ya anya n’ihu ma ya fọdụzie ịtụwa ya ime maka ngwarụ o nwere.

Ọ sị na ya ọyị na ọyi ya nwoke bụ Oshian si na Delta Steetị zutere n'ọbaozi Facebook n'afọ 2020 ma n'ime izuụka ha zutechara ka ọ bịara n'Awka ileta ya.

Dịka ha abụọ nọzi ka ọ tụrụ ime ma mụta nwa nwoke kara aka.

N'otu aka ahụ, Oshian sị na ọ hụrụ Agaezichukwu n'anya nke ukwuu na o nwere ọ hụrụ n'ime ya nke ọ na-agaghị echefu echefu.

Kirie akụkọ ha n'uju:

Akụkọ a si n'aka Nnamdi Agbanelo, Ebere Ekeopara na Chioma Obianinwa.