World Disability Day: 'Achọọla m ọrụ ọtụtụ ebe mana anaghị enye m n'ihi na abụ m ngwọrọ'
Emmanuel Eboseremhen bụ onye ngworo na-agba mbọ karịa ọtụtụ ndị ahụ zuru oke.
O ritere nturugo na Mahadum n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'agbanyeghị na ọnọdụ ya ekweghị ya nweta ọrụ, Emmanuel kwuru na ya ga-enwerịrị ụlọọrụ onyonyo nke ya.
Ọ kọkwara etu ịgụ egwu si enyere ya aka agabiga ọtụtụ ihe na ndụ ya.
Gere mkparịtaụka ya na BBC n'uju.
Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo mere akụkọ a.



