Josephine Ugwu: Nwaanyị ritere ụlọ site n'iweghachi ego ruru $12m

Aha onyonyo, Josephine Ugwu: Nwaanyị ritere ụlọ site n' iweghachi ego ruru nde dọla iri na abụọ

Nwaada Josephine Ugwu ritere onyinyo ụlọ n'aka gọọmentị maka iweghachi ego ruru nde dọla iri na abụọ($12,000,000).

Ọ hụrụ ego ndị a mgbe ọ na-arụ ọrụ dịka onye na-ehicha ụlọ n'ọdọụgbọala dị na Legọs.

Ọ gwara BBC Igbo n'agbanyeghị na o nweghi ego na ọ bụ ịtụ egwu Chineke mere o ji weghachiri onye nwe ya ego ahụ.

Josephine sị na ọtụtụ mmadụ hụtara ya dịka 'onye iberibe' mana ugbua ọ bụrụla onye nwe ụlọ nke ya.

Ọ gara n'ihu nye ndụmọdụ ka ndị mmadụ nwee ndidi ma hapụ ịgbaso agwa 'a baa taa, a nwụọ echi'.

Gere ihe o kwuru n'uju n'ime ihe onyonyo a: