Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu

Aha onyonyo, Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu

Ọkụ gbara ụlọ agadi nwaanyị a kpọọ Benedett Okeze, onye Ezimo dị na okpuru ọchịchị Udenu Enugwu steeti, gbapịara ụlọ ya kpam kpam.

Ọkụ ahụ bidoro ka e wetara ọkụ latrik jufere ejufe.

Ugbua nwaanyị ahụ gbara afọ 92, nwa ya nwoke bụ Reuben na ezịnaụlọ ya enweghị ebe ha na edobe isi nke ha na enwe ngwongwo ọbụla n'ihi na ọkụ ewerela ha ncha.