E wepụ nne m akaghị ịgbalahụ ọnwụ site n'ọrịa 'sickle cell'-Nwaanyị dị afọ 65

- Onye dere ya, Uche Akolisa & Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist &Technical Video Director
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Technical Video Director
- Ebeg o si, Legọs

Ebe foto si, Bukola Popoola
'Sickle Cell', bụ ọrịa na-egbu ọtụtụ ndị nwere ya n'ụmụaka tupu ha eruo ihe eji mmadụ eme mana Odoziakụ Bukola Popoola, meriri ọrịa dị ndụ dịkaa nka.
Ugbua ọ fọrọ ya nwaantịị ka o rue afọ 65 mana nwaanyị nke ọrụ ya bụ isi nrị nakwa ịzụ ndị na-amụ nka isinri gbasiri ike ma kajaa akaja n'ahụike nakwa ịgba mbọ.
Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ nne ya nakwa Chineke mere na ya dị ndụ taa.
Oge a mụrụ ya, ndị mmadụ gwara nne ya bụ Ọrịakụ Henrienta Olapade ka ọ tufuo ya, sị na ndị nwere ọrịa anaghị adị ndụ.
Mana Olapade sịrị, "Nke m ga-adị ndụ.Agaghị m atufu nwa Chineke nyere m "
Popoola, kọwara na ahụ ụfụ nakwa mkpachapụ so na ihe ndị ọ gabigara n'ihi 'ọrịa 'sickle cell'.
Oriakụ Olopade Popoola kọwara ihe ọ gabigara dịka onye na-arịa ọrịa 'sickle cell anaemia'.
O kwukwara na dịka ọ gụchara akwụkwọ, inweta orụ hịara ya ahụ n''ihi akamoke megide ya n'ihi ọrịa 'sickle cell anaemia'.
Mana o gbochighị ya ịgba mbọ ma na-azụlite ndị ọzọ nwere ụdị nsogbu ahụ.
Ụmụaka ọhụrụ 100,000 n'ime150,000 a na-amụ ụmụaka nwere ọrịa sickle cell na-anwụ kwa afọ tupu ha erue afọ ise, dịka Dkta Annette Akinsete si kọwaa.
Kirie ya n'uju 🖕:








