Sickle Cell Anaemia: Kedụ ka Sanni Joy Omowunmi si jiri ụkwụ isii gụpụta na mahadum?
N'ime ụmụaka otu narị a mụrụ na Naịjirịa, mmadụ abụọ n'ime ha na-enwe ọrịa ọkpọnọbara a kpọrọ 'sickle cell anaemia' na Bekee, dịka ụlọọrụ Sickle Cell Foundation si kwuo.
Nwada Sanni Joy Omowunmi so n'ime mmadụ abụọ n'ime otu narị ahụ a mụrụ nwere ya bụ ọrịa, mana oge o nwetara ohere ịga mahadum na University of Lagos, ọrịa ahụ metụtara ọkpụkpụ ukwu ya nke ndị dọkịnta kwuru na ọ gaghị agali ije naanị ya.
E nyere ya osisi nwere ụkwụ anọ ga-enyere ya aka ịga ije, mana ndị ntọrọọbịa ụfọdụ achọghị ịhụ onye nwere ụkwụ isii gụnyere na a rụghị ụlọakwụkwọ mahadum maka ndị nwere nkwarụ.
N'etiti akaja ndị ụfọdụ mere ya na nsogbu ịga klaasị, lee ka nwada Joy kọọrọ gị etu o siri jirizie ụkwụ ya abụọ gụchaa mahadum ma a waghị ya ukwu.
Gịnị bụ ọrịa ọkpọnọbara - 'sickle cell anaemia'?

Ebe foto si, Joy Omowummi
Ọrịa ọkpọnọbara bụ ọrịa kachasị esi na mkpụrụndụ efe n'ụwa niile gbaa gburugburu.
Ndị bu ya bụ ọrịa siri n'ahụ nne na nna ha bute mkpụrụndụ bu ya nke a kpọrọ jenotaịpụ.
Ọ bụ ọrịa na-ebute ezigbo ahụ ụfụ nye ndị na-agabiga ya, nke nwada Joy gwara BBC Igbo na ọ dị ka mmadụ ejiri ntu na-akpọ gị n'ime ọkpụkpụ.
N'ime mmadụ 100 a mụrụ na Naịjirịa, ụmụaka abụọ na-ebu mkpụrụndụ ahụ nwere 'sickle cell' nke bụ na ha na-arịa sickle cell.
Dịka ndị ọrụ ahụike siri kwuo, anaghị etofe ọrịa a etofe, kama naanị iwere ụmị ọkpụkpụ dị mma tinyere onye nwere ọrịa ahụ nke a kpọrọ 'stem cells transplant' bụ ihe nwereike ịkwụsị ya.
Ya bụ ọrịa egbuola otu onye mgbasaozi redio a ma ama na Naịjirịa aha ya bụ Tosyn Bucknor.


