World Sickle Cell Day: Ihe mere m ji enyere ndị bu ọrịa 'Sickle cell' aka

Aha onyonyo, World Sickle Cell Day: Ihe mere m ji enyere ndị bu ọrịa 'Sickle cell' aka

Maureen Nchekwube bụ otu nwagbọghọ, onye ya na ụmụnne ya abụọ rịara ọrịa 'sickle cell' akọwala ihe ha gabigara nke mere ha ji enyere ndị bu ọrịa a aka ugbua.

Ọ sị na mgbe ọ gara Mahadum ka ọ chọpụtara na ọtụtụ mmadụ amaghị ihe gbasara ọrịa nke ọma, na ọ bụ ebe ahụ ka ọ malitere ikuziri ndị mmadụ ihe banyere ya.

Mgbe ọ gụchara akwụkwọ o kpebiri na o nweghi ihe ọzọ ọ ga-arụ ma ọ bụghị ị na-enyere ndị bu ọrịa 'sickle cell' aka etu ha ga-esi chekwaa ndụ ha.

Nchekwube sị ihe ọzọ ha na-eme bụ ịkwado ụfọdụ n'ime ndị na-enyeghi ego ha ji aga ụlọọgwụ site n'inye ha ọgwụ.

O nyekwara ndụmọdụ sị tupu nwoke na nwaanyị ana-alụ onwe ha gbalịa gaa ụlọọgwụ mee nyocha ahụ a kpọrọ 'Genotype' ka nwee ike gbanarị ọghọm dị n'ịmụta nwata bu ọrịa 'sickle cell'.

Kirie ihe o kwuru n'uju.

Onye mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka

Akụkọ ndị ga-amasị gị: