Twitter voice note: Ihe ị kwesịrị ịma maka ya

Ọba ozi twitter

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Soshal midia na-enwu ọkụ maka atụmatụ ọhụrụ Twitter wepụtara a kpọrọ 'Twitter voice note' nke ga-eme ka i zipu olu gị n'ọba ozi ha.

Ụlọọrụ Twitter sị na nke a ga-adị ire naanị n'igwe ekwentị bu akụrụngwa iOS ugbua.

Aha onyonyo, I nwereike ?hap? soshal midia n'otu ?b?ch??
Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ha sị na ha mere nke a maka na ọtụtụ ozi ndị mmadụ nwereike ifu maọbụ aghọtaghie ha n'akara edemede, mana olu okwu mmadụ agahị eme etu a.

Mana ndị nwere ekwentị bu akụrụngwa 'Android' na-ewe iwe etu Twitter ji ghara itinye ha n'atụmatụ a.

Ihe kwesịrị ịma maka ya:

Oge mmadụ nwere ikwu okwu bụ tịnkọmtịnkọm 140 nke bụ nkeji abụọ na tịnkọmtịkọm 20.

Ị nwereike iji ya zie ozi ugboro ole ọbụla ị chọrọ na Twitter.

A naghị eji ya akparịta ụka dịka ọ dị na 'Whatsapp' kama ọ bụ naanị izipu ozi.

I nwereike ị na-ege ntị n'olu ozi a ma na-emekwa ihe ndị ọzọ n'ekwentị gị.

Ụzọ ise ị ga-eji tinye olu gị n'ọba ozi Twitter

Mepee ọba ozi Twitter gị ma pịa aka n'ebe ị ga-edebanye ozi.

Pịa aka n'akụrụngwa na-egosi igwe e ji ekwu okwu.

Pịa ya aka ma malite kwuwe ozi ọbụla ị chọrọ izipu.

I nwereike ịgbakwụnye mkpụrụokwu edemede n'olu gị ahụ maọbụ tinyekwuo olu gị ọzọ.

Mgbe ọbụla ị dị njikere izipu olu gị a, pịa aka n'akara nzipu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: