Dan Foster: Ihe onye mbụ were ya n'ọrụ na Naijiria na ndị ọzọ ma ya na-ekwu maka ya

Ebe foto si, Dan Foster/ Chris Ubosi
Ọ bụ onye ọbịa na Naijiria maka kemgbe ụbọchị Fraide akụkọ ọnwụ ya pụtara ife, ụmụ Naijiria ọkachasị ndị ma maka Dan Foster ka na-atụ arịrị ọnwụ ya.
Foster bụ olu a ma ama n'ihe gbasara igwe mgbasaozi redio na Naịjiria, nwụrụ ụbọchị Wednezde ka ọ rịachara ahụ nwa oge site n'ọrịa coronavirus.
Na nkọwa ụdị mmadụ Dan Foster bụ, Chris Ubosi bụ onye nwe ụlọọrụ 'Beat FM' kọwara na "ọ bụ ezigbo mmadụ. I nwee nsogbu ọbụla, Dan ga-ewe ya ka nke gị".
Ubosi, onye si na ịbụ onyeisi ya bụrụ ezigbo enyi Dan Foster kọwara na "Dan bụnụ onye Naijiria. Ị hụkwanụ ya, akwa Naijiria ka ọ na-eyikarị, nri Naijiria ka na-amasị ya."
Ubosi bụ onye mbụ so gbaa Foster ajụjụ ọnụ e jiri wee ya n'ọrụ mbụ ya na Naijiria sị na "ezigbo onye ọrụ na-arụkarịa ole e ziri ya rụọ."
Gee Ihe Ubosi Kwuru maka Dan Faster.
Ihe ndị ọzọ a ma ama na-ekwu maka ya
- Frank Edoho bụ onye ọrụ onyonyo TV a ma ama kọwara Dan Foster dịka 'ezi enyi' Afọ a bụ ezigbote afọ ọjọọ. Kedụ ka m ga-esi edinwu ọnụma a."
- Ben Murray-Bruce nwe 'SilverBird FM' kọwara "Ọnwụ Dan Foster wutere m. Ọ bụ ezigbo enyi m na onye redio kajara akaja."
- Ọkpaọchị Bovi kwuru na oge ọ zabeghị mmadụ,tupu ya abụrụ onye a ma ama , na ọ bụ "ige Dan Foster na redio mere na m esighị na Legọs gbaghachi Delta."
Ihe ise ị maghị maka Dan Foster
1. Dan Foster bụ onye Amerika lụrụ ọrụ na ụlọọrụ mgbasaozi na Amerịka tupu ọ bịa Naijiria.
2. Ebe mbụ ọ lụrụ ọrụ bụ na Ụlọọrụ redio 'Cool FM'
3. O biela na Naijiria afọ 20 ma lụgharịa onye Naijiria Igbo dịka ya na nwunye mbụ ya, mụtara ya otu nwa gbasara.
4. Foster a na-etu 'Big Dawg' lụrụ onye Igbo, nwa ada Enugwu aha ya bụ Lovina, ha mụkọrọ ụmụ abụọ.
5. Ejiji Naijiria na nri ha na-amasị Dan Foster nke ukwu










