Africa Eye: Etu m si ebuagha megide oke a na-akpasị ndị nwere ọrịa 'sickle cell'
Africa Eye: Etu m si ebuagha megide oke a na-akpasị ndị nwere ọrịa 'sickle cell'
Lea Kilenga bụ nwagbọghọ a mụrụ n’ọrịa kansa ọbara a kpọrọ ‘sickle cell’ kọwara ihe ọ ga-abigara kamgbe a mụrụ ya rute ugbua.
Ọtụtụ ndị a mụrụ n’ọrịa a na mpaghara Afrịka na-anwụkaarị oge ha ruru afọ ise.
Onye dọkịta gware nne na nna Lea na ọ agaghị etonwu ruo n’ogogo nwagbọghọ mana ugbua Lea bụrụla olileanya nye ọtụtụ ụmụaka nye ụmụaka nwere ọrịa ‘sickle cell’ na Kenya nakwa Afrịka.

Ọ na-emeri nsogbu ịkpa oke so n’ọrịa nakwa gọọmenti na-enweghi inyere ndị nwere ọrịa a aka.
Lee sonyere n’ọsọ e gbara na mba ha iji nyere ụmụaka ndị nwere ọrịa a aka na-agbanyeghi na ndị dọkịta dọrọ aka na ntị ka o mela ya.
Ndị Afrịka bụ mba ụmụ aka kachasị enwe ọrịa a nke na-egbu ọtụtụ puku ha kwa afọ ọbụla.
Kirie akụkọ n’uju ebe a;


