Akpa ara gị o nwere ike ibutere gị ọrịa?

Ị maara na e nwere nnukwu ihe jikọtara akpa ara ị na-eyi na ahụike gị?
Ena Tychus bụ Dọkịnta ahụike na onyeisi ụlọọrụ ahụike GETMEDCO mere ka o doo anya na onye na-eyi akpa ara bekee kpọrọ 'bra' nke pere oke mpe, nwereike inwe nnukwu ihe mgbu n'ubu ya, mgbu olu, mgbu azụ, mgbu ọgịrịga na obi mgbu.
Dọkinta Ena kwuru na iyi akpa ara 'bra' dị obere nwereike imetụta ahụike gị dum, ọkachasị ma a bịa n'ihe gbasara ọnọdụ ahụ mgbu na ihe ndị dị ka nke ahụ.
Dịka o si kwuo, ị na-eyi 'bra' pere oke mpe, ihe na-eme bụ na ị nwereike inwe nnukwu mgbu n'ubu gị, mgbu olu, mgbu azụ, mgbu ọgịrịga na obi mgbu.
I nwekwara ike ibute ọrịa 'nje' dị oke njọ dịka ọkọ na mgbaji oji akpụkpọ ahụ dị n'okpuru ara gị.
Ọ dị oke mkpa na ị na-eyikwasị akpa ara 'bra' nke kwesịrị gị.
Ugbua, kedụ ka ị ga-esi mara na akpa ara ahụ a bụghị nha gị?
E nwere mmetụta nke bekee kpọrọ "Quad-Boob Effect" nke a pụtara na ara mmadụ si n'akpa ara 'bra' na-enupụta.
Ya mere, ị maara na nke ahụ a bụghị nha gị, ọ na-adị gị ka ahụ adịghị mma, ọ na-afụkwa gị ụfụ nke ukwuu, ị gaghịkwa enwe ike ichere iyipụ ya.
Ya mere, n'ọnọdụ dị otu a, anyị na-akwado gị nke ukwuu ka ị gbanwee nha ahụ wee nweta akpa ara 'bra' nke dabara gị nke ọma.
N'agbanyeghị na Dr. Ena kọwara ihe ọghọm dị n'iyi akpa ara pere oke mpe, o nyekwara ndụmọdụ mgbe ụmụnwaanyị kwesịrị iyi akpa ara na mgbe ha na-ekwesịghị.
O nwere mgbe mmadụ ekwesịghị iyi akpa ara?
Dọkịnta Ena kwuru na mmadụ ekwesịghị iyi akpa ara n'abalị.
"A na-enye ndụmọdụ ka ị ghara iyi akpa ara ehi ụra. Ọ na-enyere aka ime ka ọbara na-erugharị n'ime ara na mpaghara obi gị nke ọma. Ọ bụrụ na ara gị pere mpe ma ịchọghị nkwado ahụ, ịkwesighi iyi akpa ara," ka ọ kọwara.
O kwuru na mgbe ị na-eyi akpa ara 'bra' nke pere mpe, ị na-akpachapụ akwara nke na-ejide ara gị elu, nke a nwereike ime ka ara gị daa.
Ọ gbakwunyere na e nweghị ihe ọjọọ ọ bụla ma ị ghara iyi akpa ara 'bra'.



