Ihe m jiri anya m hụ ka m jiri ọgbaatumtum gaa Jamini - Nwaanyị na-agba ọgbaatumtum

Aha onyonyo, Ihe m jiri anya m hụ ka m jiri ọgbaatumtum gaa Jamini - Nwaanyị na-agba ọgbaatumtum
Ihe m jiri anya m hụ ka m jiri ọgbaatumtum gaa Jamini - Nwaanyị na-agba ọgbaatumtum
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Ogboru Akpevwe bụ nwaafọ Ajalomi Abraka dị na Delta Steeti ma bụrụkwa onye na-agba ọgbaatumtum 'powerbike'.

Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, nwaada ahụ ji ọkwa Assistant Comptroller n'ụlọọọrụ 'Customs' kọwara ihe kpaliri mmụọ ya iji ọgbaatumtum gaa mba Jamini nakwa ihe ndị ọ gabigara n'ụzọ.

"N'ụlọọrụ Nigeria Customs Service, anyị na-agba mbọ ịkwalite mgbereahịa, nke ahụ bụ nnyocha e mere n'ókèala dị iche iche, agba nke abụọ ya ka m na-ekwu. Nnyocha ahụ bụ iji ghọta ihe ndị na-atụ mgbere, ndị njem na ndị nlereanya na-agabiga n'ókèala dị iche iche na mpaghara Afrịka nakwa Yurop nakwa ihe ndị anyị kwesịrị ịmụta," ka Akpevwe kwuru.

Ọ sịrị na nnyocha a ga-enyere ụlọọrụ Customs aka ịchịkọta usoro ọrụ ha nakwa ihe ndị ha chọrọ maka iji kwalite ịtụ mgbere n'ókèala dị iche iche.

Akpevwe kọọrọ anyị na ya hụrụ ezi ọhịa n'obodo Tambacounda dị na mba Senịgal bụ nke a maara dịka Pumbaa n'ejije 'Lion King'.

Dịka nwaada ahụ siri kọọrọ anyị, o si Naịjirịa gaa Benin Rịpọblik, si ya banye Togo, si ebe ahụ banye Bọkịna Faso, si ya gaa Mali, si ebe ahụ gaa Senịgal, sikwa ebe ahụ banye Mauritania, si ebe ahụ banye Moroko, si ya gaa Spen, site ebe ahụ banye Fransị, si ya gaa Beljọm, site ebe ahụ banye Netherlands, sizie ya banye Jamini.

O kwuru na ya zutere nnukwu okpomọkụ n'ọzara Sahara nke ogogo ya ruru 47°, mana ndị na-ere mmanụ ụgbọala n'ụzọ nyeere ya aka ma doziere ya ebe o nwereike ịnọrọ rahụ ụra ma nweta onwe ya.

"Oge m ṅụchara mmiri ma wụọ mmiri oyi n'ahụ m, anọọrọ m ọdụ ebe ahụ ma chọọ ịrahụ ụra. Ha asị m "bịa tọgbọrọ ebe a". Ha weteere m ute na ihe nhiwe isi ma sị na m kwesịrị izu ike. Nke a gosiri mmụọ nke ndị Afrịka, mmụọ nwanne. Ha amaghị onye m bụ maọbụ ebe m si mana ha nwereike igosi m ọmịiko," ka o kwuru.

Akpevwe kọọrọ anyị na ya hụrụ ezi ọhịa n'obodo Tambacounda dị na mba Senịgal bụ nke a maara dịka Pumbaa n'ejije 'Lion King'.

Akpevwe kwuru na isiokwu njem ya bụ "Ịkwọ ọgbaatumtum maka iji gụnye ụmụnwaanyị: Ịkwalite ọnọdụ ụmụaka ndị nwaanyị".

Dịka o siri kwuo, nke ahụ bụ ozi nyere ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị nwaanyị, iji kụziere ha mkpa okwukwe, nkwudosiike, olileanya na ntụkwasịobi bara, nakwa iji sị ha adala mba n'ebumnobi ha.

O kwuru sị: "E nwere ọnwụnwa, e nwere nnwale, e nwere ihe ndọghachiazụ mana i kwesịrị ịkwụrụ n'ụkwụ gị wee na-aga. Ọ bụ nke ahụ bụ ebumnobi ihe a."