Ihe mere m jiri gbasie ike rute ugbua m gafere afọ 120 - Onye nna Anthony Onyegbule

Aha onyonyo, Nnanna Anthony Onyegbule karịrị afọ 120
Ihe mere m jiri gbasie ike rute ugbua m gafere afọ 120 - Onye nna Anthony Onyegbule
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Maazị Anthony Onyegbule bụ okenye ndị ezinaụlọ ya kwuru na ọ ga-agba afọ otu narị na iri abụọ na asatọ (128) n'ụbọchị 9 Maachị 2026.

BBC Igbo chọpụtara nke a oge anyị na Maazị Anthony Onyegbule na ndị ezinaụlọ ya nwere mkparịtaụka pụrụiche na nso nso a.

Otu nwa ya nwoke bụ Vincent Onyegbule kọọrọ anyị na nna ya anaghị eji ike arịa ọrịa, karịakwa ugbua o merela nnukwu okenye, ọ na-abụ ya gagharịa maọbụ kwuo okwu, ọ malite inwe ume ọkụ.

Ọ sịrị na ọ bụ nna ya na-asa onwe ya ahụ ma bụrụkwa ya na-azacha ime ụlọ o bi n'ime ya.

Ọ kọwara na o nweghị nri pụrụiche nna ya na-eri, kama ihe ọbụla e nyere ya, ọ nara, ma ọ bụrụ na ahụ ya na mmụọ ya nabatara ya.

Maazị Anthony Onyegbule n'onwe ya kwuru na ya amaghị afọ a mụrụ ya kpọmkwem, kama, ọ bụ nwata oge nne ya sooro ụmụnwaanyị lụọ ọgụ n'Aba.

"Nne m bụ Lọlọ Urewunwa so n'ime ụmụnwaanyị ndị lụrụ ọgụ ụmụnwaanyị. Oge ahụ, anọ m n'ime ụlọ n'abalị mgbe ha pụrụ, ma buru osisi (akakpụ) nwechara ogwu n'ahụ ha. Ha ejighị mma maọbụ egbe. Ha apụọ sị na ha na-aga ọgụ ụmụnwaanyị n'Aba," ka o kọrọ.

N'aka nke ya, Vincent Onyegbule kwuru na ha cheburu na nna ha dị afọ 109 maọbụ 110, ruo ụbọchị ha chọtara leta ọgọ ya nwoke deere ya na senchuri 18.

"Ọ bụ oge anyị hụrụ ihe a e dere na foto a ka anyị gbakọrọ afọ ya, iji chọpụta, maka na oge mbụ anyị cheburu na ikekwe, ọ dị afọ 109 maọbụ 110, mana oge anyị hụrụ ederede a n'afọ gara aga bụ 2025 ka m gbakọrọ ya".

"E dere leta a n'ụbọchị 15 Disemba, senchuri 18. E dere ya ebe a. Ọ bụzi afọ a nọ ebe a ka anyị jiri gbakọọ ya iji chọpụta na ọ bụ n'afọ 1898. Oge anyị jụrụ ya, o kweta na ya akarịala afọ 22 tupu ọ lụọ nwaanyị".

"Anyị gbakwunyere ya n'afọ nke anyị na-agbakọrọ ya na mbụ, ọ pụtazie 127. N'ụbọchị 9 nke ọnwa Maachị ka ọ ga-adị afọ 128," ka Maazị Vincent Onyegbule kọọrọ anyị.

Maazị Anthony n'onwe ya kwuru na ya amaghị afọ a mụrụ ya kpọmkwem, kama, ọ bụ nwata oge nne ya sooro ụmụnwaanyị lụọ ọgụ n'Aba.

Maazị Anthony Onyegbule bụ nwaafọ Ụmụchoke Ọbazụ Mbieri dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Mbaitoli nke Imo Steeti.

O kwuru na ya chere na Chineke nyere ya ogologo ndụ n'ihi na ya bụ onye na-ekwu eziokwu na onye na-anaghị ezu ihe mmadụ n'ohi.

Ka o sina dị, o gosiri mwute na ndị ha na ya soro tolite anwụchaala, ma kwuo na ya na-ekele Chineke maka idowe ya ndụ n'ihi na ụfọdụ ndị obodo na-achọ ịnara ụmụ ya ihe nketa ha n'ike.

Nwa ya nwoke bụ Vincent Onyegbule kwuru na obi dị ya ụtọ inweta Maazị Anthony dịka nna.