Eji m ekwentị ndị mmadụ malite ime ihe nkiri - Akwaman

- Onye dere ya, Doanld Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
Nwaokoroọbịa a ma ama na-eme ihe nkiri bụ Akwaman akọwaala etu o siri malite ime ihe nkiri oge ọ ka nọ n'ụlọakwụkwọ.
Oge ya na BBC nwere mkparịtaụka pụrụiche, Akwaman, onye ezigbo aha ya bụ Daniel Ekpe kwuru na ya malitere ime ihe nkiri oge ọ nọ na klaasị nke anọ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị site n'iji ekwentị ụmụ klaasị ya.
Akwaman, kwuru na ya na-azabu "Akwacros", nke bụ aha ụmụakwụkwọ ibe ya nyere ya n'ihi na ya bụ onye Akwa Ibom na-aga akwụkwọ na Cross River.
Akwaman bụ nwa onye ụkọchukwu n'ụlọụka Presbyterian Church, onye na-eme ihe ọchị nakwa onye na-eti ịgba bekee.
Ọ bụ nwaafọ Akwa Ibom gụrụ ihe ọmụmụ Food Science and Technology na mahadum University of Uyo.
Akwaman kwuru na ya wepụrụ obi n'ihe gbasara ime ihe nkiri n'afọ 2022 tupu o mechaa malite ọzọ n'afọ 2023.



