Ụfọdụ mmadụ chọrọ ka ha dinaa m tupu m mee ejije - Sunshine Rosman

Aha onyonyo, Ụfọdụ mmadụ chọrọ ka ha dinaa m tupu m mee ejije - Sunshine Rosman
Ụfọdụ mmadụ chọrọ ka ha dinaa m tupu m mee ejije - Sunshine Rosman
Ụfọdụ mmadụ chọrọ ka ha dinaa m tupu m mee ejije - Sunshine Rosman

Ebe foto si, Sunshine Rosman

    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Nwaada a ma ama na-eme ejije bụ Sunshine Rosman ekpugheela etu ụfọdụ ndị na-ahazi ejije siri gwa ya ka ha dinaa tupu e nye ya ohere isonye n'ejije.

N'oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Sunshine Rosman kwuru na ọnọdụ a abụrụla otu ihe ọjọọ e ji mara Nollywood.

Ọ kọwara na ọ bụghị naanị ụmụnwoke na-akpa agwa ọjọọ dị etu a, kama ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị na-ahazi ejije na-achọkwa ka ha na ụmụnwoke ndị na-eme ejije dinaa tupu e nye ha ohere isoro mee ejije.

Rosman kwukwara okwu gbasara ọnọdụ ndị na-eme ejije na-agabiga, ọkachasị mgbe ha na-eme ejije nke YouTube.

"Omume ha na-emeso anyị oge anyị na-arụ ọrụ ụfọdụ, ọkachasị nke YouTube, adịghị mma. Mmadụ ga-amalite ime ejije n'oge ụtụtụ ma mechaa n'ime abalị".

"Dịka nwaagbọghọ, ị na-agbagharị n'ime abalị, ma ị makwa na ọnọdụ nchekwa obodo a adịchaghị mma nke nwaanyị ịgba naanị ya maọbụ ịbanye n'ụgbọala," ka Sunshine Rosman kwuru.

Sunshine Rosman nwa ada Igbo nna ya bụ onye mba Kanada yi efe na-acha aja ma buru isi afro ndị Afrịka

Ebe foto si, Sunshine Rosman/Instagram

Nkọwa foto, Kayode Peters kpuchitere m n'aka ndị chọrọ idina m tupu m mee ejije - Sunshine Rosman