Nkwado Phyno mere m ihe m bụ taa - Aguero Banks

Aha onyonyo, Ise anwụrụ anaghị enye 'inspiration' e ji ede egwu - Aguero Banks
Nkwado Phyno mere m ihe m bụ taa - Aguero Banks

Otiegwu Chukwubuikem Ogbonnaya Francis Chukwu a maara dịka Aguero Banks akọwaala etu njem ya dịka otiegwu a ma ama si malite.

Na mkparịtaụka ya na BBC News Igbo nwere na nso nso a, Aguero Banks kwuru na njem egwu ya malitere oge ọ dị na nwatakịrị.

N'okwu ya "Nna m bụ onye na-agwakọ egwu bekee kpọrọ DJ. Ọ bụ ya mere m ji mara ma malite ịgụ egwu dịka nwatakịrị."

Aguero Banks gwara anyị na nne na nna ya amaghị na ọ malitere iti egwu maka na chọrọ ka o gaa mahadum bụrụ Dọkịnta maọbụ onye ọkaiwu.

"Nne na nna anyị oge ahụ na-achọ ka ụmụ ha gaa mahadum, gụọ akwụkwọ maka na ọ bụ etu ahụ ka ụfọdụ ji gbanarị ụbịam n'oge ha toro ".

O mere ka ọ doo anya na ọ bụrụ na ọ naghị eti egwu taa, na ọ bụ bọọlụ ka ọ kara ị na-agba maka na ọ gbara asọmpi Enugu State Football League.

Aguero Banks ya na Phyno si zute onwe ha nakwa etu mmekọ dị n'etiti ya na Phyno si gbanwee ndụ ya.

Ụfọdụ ihe ọzọ o kwuru bụ banyere uru dị n'iti egwu nakwa etu ndị na-eti egwu si enweta ego.

"Onye ọbụla chọrọ ịma ka egwu a na-enye ego, bụ mụ ka o kwesịrị ile anya maka na ọ bụ egwu nyere m ego taa ma gbanwee ndụ m na ezinaụlọ m".

Ọ gwara ndị chọrọ iti egwu ka ya ka ha na-agba mbọ ma rụọsie ọrụ ike iji hụ na egwu ha banyere ma mee ka ha soro n'ihe a na-eme.

Ọ dọrọ aka ná ntị ma kwuo na onye ọbụla chọrọ iti egwu kwesịrị ịma na enweghị anwụrụ maọbụ mmanya na-aba n'anya nakwa ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka dee egwu ma ọ bụrụ na ha enweghị onyinye ide ma gụọ egwu.