Abụ m onye mbụ gara mahadum n'ezinaụlọ m - Mc Monica
Abụ m onye mbụ gara mahadum n'ezinaụlọ m - Mc Monica
Edeh Sylvester Chisom a maara dịka Mc Monica bụ onye na-eme ihe ịkpaọchị bekee kpọrọ 'comedy' kwuru na ọ bụ ịkpaọchị mere ka ya bụrụ mmadụ taa.
Na mkparịtaụka anyị na ya nwere, O kwuru na ọ bụ onye mbụ gara mahadum n'ezinaụlọ ya.
Mc Monica gbara n'anwụ etu njem ya dịka onye ịkpaọchị si malite oge ọ nọ na mahadum na Bayelsa Steeti nakwa atụmatụ dị iche iche o nwere banyere inyere ụmụaka ụwa na-atụ n'ọnụ aka na Naịjirịa.
O kwuru na nna ya malitere ịkwado ya dịka onye ịkpaọchị ngwa ngwa ọ hụrụ na ya na ndị a ma ama n'obodo na-emekọta.







