Etu mụ na nwunye m si malite iti egwu - Mr M and Revelation
- Onye dere ya, Michael Ngene, Ikechukwu Kalu, Kelechi Anozie
- Ndị mere akụkọ a, Journalist, Senior Journalist na Video Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Onye otiegwu bụ Miracle Orabueze onye e ji Mr M mara, agbaala n'anwụ etu ya na nwunye ya bụ Promise Miracle Orabueze si malite itikọ egwu dịka di na nwunye.
Na mkparịtaụka Mr M na BBC nwere, ọ kọwara anyị etu ije ya dịka otiegwu si malite, etu ya na nwunye ya si zute onwe ha na mahadum Ebonyi state University nakwa etu aha egwu ha bụ Mr M and Revelation si pụta ìhè.
Ọ kọwaara anyị na otu ihe dị iche n'egwu ha bụ na ha na-ekpe ekpere ma chọpụta ihe bụ ebumnobi Chukwu banyere egwu ọbụla Chukwu nyere ha tupu ha etie ya.
Mr M na nwunye ya kwuru ọtụtụ ihe banyere ọrụ ha dịka ndị na-eti egwu, etu ha si ahazi ezinaụlọ ma na-ebi n'udo dịka di na nwunye n'agbanyeghị ọrụ ha dịka ndị na-eti egwu a ma ama nakwa ihe ndị dị mkpa na-enweta ezi agamnihu n'ezinaụlọ.
Ha kọwara na ha na-akụnye ezi mkpụrụ na ndụ ndị ọrụ ha ma na-agba ha ume ka ha bụrụ ndị kwụrụ onwe ha ma na-eme ọfụma n'ezinaụlọ ha dị iche iche.










