Enweghị ihe gbasara ndị uweojii n'okwu Speed Darlington na Burna Boy - Deji Adeyanju
- Onye dere ya, Michael Ngene
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
Ọkaiwu a ma ama bụ Deji Adeyanji ekwuola na nwuchi ahụ ndị uweojii nwuchiri Speed Darlington megidere iwu n'ihi na enweghị ihe gbasara ndị uweojii n'okwu dịịrị ya na Burna Boy maka na ọ bụ okwu obodo nke bekee kpọrọ 'civil matter'.
Na mkparịtaụka Adeyanju na BBC nwere, ọ gwara onye ọbụla mmadụ kparịrị ka ọ gaa n'ụlọikpe ma gbaa onye ahụ akwụkwọ.
Ọ gbakwụnyere na enweghị ihe gbasara ndị uweojii n'okwu ọbụla gbasara mkparị mmadụ.
Adeyanju kowara nwuchi Speedy Darlington dika atụmatụ goomenti ji ibu agha megide nnwereonwe ikwu okwu na Naijiria.
Ọ gara n'ihu kwuo na ka ọ dị na Naịjirịa ugbua, e meghariala mpaghara 24 nke iwu Cybercrime Act Naijiria. O kwuru na enweghi iwu obula banyere cyberbullying na Naijiria.
Cheta n'onwa Ọktoba 2024, ndị uweojii nwuchiri otiegwu Speed Darlington a maara nke ọma dịka 'Akpi' ma kpuchie na nga abalị atọ.
Akụkọ kwuru na ọ bụ Damini Ebunoluwa Ogulu a maara dịka Burna Boy kpọrọ ndị uweojii ahụ nwụchiri Speed Darlington.
Nnwuchi a bụ maka ihe onyonyo Speed Darlington kesara n'akara soshal midịa ya. Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe Akpi na-ebo Burna Boy ebubo dị iche iche gụnyere mmekọ ya na otiegwu mba Amerịka bụ P Diddy, onye a nwuchiri maka ebubo imetọ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị.
Burna Boy degaara ndị uweojii akwụkwọ ma kwuo na ebubo ndị ahụ Speed Darlington boro ya metọrọ aha ya nke bekee kpọrọ “defamation and cyberstalking".
Mana ka a nwụchiri Speed Darlington, akụkọ malitere iwu na soshal midịa na a na-achọ Speed Darlington achọ.
Nne Speed Darlington mere ihe onyonyo ebe ọ rịọrọ Burna Boy ka ọ tọhapụ nwa ya nwoke bụ Akpi. Ihe onyonyo ahụ o mere fesara na soshal midịa, nke mere ọtụtụ mmadụ ji mara ihe na-eme.
Ezinaụlọ, ikwu na ibe Speed Darlington malitere ịchọ usoro ha ga-eji gbapụta nwa ha nwoke n'aka ndị uweojii.
Ha gara n'ihu kpọtụrụ ọkaiwu Deji Adeyanju onye malitere ịkpọ ọkụ dị iche iche iji chọpụta ụlọ ndị uweojii e ji Speed Darlington.
A chọpụtara na ọ bụ n'ụlọọrụ ndị uweojii dị na Guzape Abuja ka a kpọchiri Speed Darlington.
Deji Adeyanju gara n'ihu tinye akwụkwọ maka ntọhapụ beelu Speed Darlington.
E nyere Speed Darlington ntọhapụ beelu ka o mezuru ihe niile di n'iwu ma weta ihe niile o kwesiri iweta maka ya.



