Arụọla m ụlọ mekwa ihe ndị ọzọ site n'ịgwakọ egwu- DJ Commissioner Wysei

Ebe foto si, DJ Commissioner Wysei/Instagram
- Onye dere ya, Uche Akolisa & Kelechi Anozie
- Ndị mere akụkọ a, Senior journalist/Video Journalist
N’ụtụtụ abalị 18 nke ọnwa Eprelụ afọ 2024, ọ kpọtụrụ na soshal media na ndị uweojii Legọs nwụchiri ọgwakọ egwu ama ama bụ Uju Catherine Udeh a ma ama dịka ‘DJ Switch’ maka ebubo iti ndị uweojii aka.
Mana tupu chi e ji e ụbọchị ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Benjamin Hundeyin kwugharịrị sị na ọ bụghị DJ Swith kamaba ọ bụ DJ Commissioner Wysei bụ onye eziaha ya bụ Ebere Iwuagwụ, ka ha nwụchiri maka ebubo iti onye uweojii aka.
Cheta n’abali 18 nke ọnwa Eprelu afọ 2024, ndị uweojii Legọs wepụtara ozi na ha nwuchiri DJ Commissioner Wysei maka ebubo iti onye uweojii ihe ma jụ ka a nwuchie bụ nke ha kwuru mere dịka ọ bịara mkpesa n’ogige ha.
Mana na mkparịtaụka ya na BBC Igbo na nwada Mbaise, Imo steeti nwere dịka ọ pụtachara na mkpọrọ Kirikiri ebe a tụnyere ya, DJ Commissioner,kwuru etu mmiri si banye opi ụgbọgụrụ.
Ọ kọwara na nsogbu ahụ dapụtara n’ọnwa Novemba afọ 2023 oge ya na otu nwoke anyị achọghị ịkpọ aha ya nwere mkpebi ịkpọ ya gaa Yurop ka ọ gaa gwakọ egwu.
Mana ọ kọwara na oge o ruru ebe ahụ, ihe adịghị dịka ha siri kpebie.
O kwuru na ọ bụghị naani na nwoke ahụ ahazighị njem ọrụ ahụ etu o kwesịrị, na ọ kwụghị ya ụgwọ ya, kama ọ gbaziri ego n’aka ya ma kpaa agwa mere ka ngwa ọrụ ya fuo n’ọdọụgbọelu.
Ọ kọwara na ọ gara kpesara ndịuweojii oge ọ laghachiri na Naijiria, ha ga nwuchie nwoke ahụ ma tụnye ya n’ụlọ mkpọrọ ha.
Mana na oge ndị uweojii jụrụ ya ihe ọ chọrọ, ọ gwara ha ka nwoke ahụ kwụọ ya ego dị nde naira iri na ise(N15m), gochiere ya ngwaọrụ ya furu efu ma deere ya akwụkwọ mgbaghara n’ọha maka mkpagbu na nkwụtọ nwokke ahụ kwụtọrọ ya.
O kuwuru na dịka ha pụrụ ụ n’iro ime ihe onyonyo arịriọ mgbaghara, nan woke ahụ kwuru na ọ chọrọ mgbanwe akwa iji mee ya mana dịka ọ gara ịzụta akwa pụta,,ọ pụtara hu ka onyeuweojii okwu ahụ dị n’aka kwọ nwa amadi ahụ apụ n’ogige ndịuweoji.
O boro ebubo na dịka ọ na-ajụ ha ebe ha na-aga, ọkaiwu nwaamadi ahụ ji ụgbọala ya dochie ụzọ, ya nay a e were nwee tụmsara.
“Dịka m na ya asarịta onwe anyị okwu, otu nwaanyị si n’azụ kụa m aka”
"M atụgharịa, jụọ ya, ‘kedụ ihe butere nke a?’”
“O wepụrụ ugegbe anya m, gwunye m aka n’anya.”.
Ọ kọwara na ha gawara ikpe ikpe na egwunyere ya aka n’anya ma merụọ ya ahụ gakwuru onyeisi ogige ndị uweojii ahụ, nwoke ahụ gechaaa mkpesa ha abụọ ma sị ya gawazie, Mana ya jụrụ sị ya ‘kedụ ka ya ga-esi nọrọ mmadụ a kụọ ya ihe ma gwụnye ya aka n’anya, gị asị ya lawa.”
O kwuru na ihe ọzọ mere bụ na ha nwụchiri ya, ma kpochie ya napụ ya ekwentị ma jụụ inye ya ohere ịkpọ ọkaiwu ma ọbụ ịhụ dọkịta dịka ọ nwere nsogbu ọnyaafọ n’ebe ahụ.
Lee ihe ndị ọzọ o kwuru n’uju:
Kedụ ihe ndị uweojii nwere ikwu?
BBC Igbo akpokula ndị uweojii ka ha zara ọnụ ha n'okwu a mana ha asabeghị ozi na ugboro niile anyị kpọrọ ha n'ekwenti.



