Ụgwọọnwa opekatampe: Ndị ga-eri ya, ndị ọ gaghị eru aka na ihe ndị ọzọ so ya

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Uche Akolisa & Aisha Babangida
- Ndị mere akụkọ a, Senior journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Onyeisiala Naiijiria bụ Bola Tinubu ebinyela aka n' iwu nhazigharị ụgwọọnwa Opekatampe nke afọ 2024 ka ọ bụrụ puku naira iri asaa (N70,000.)
Iwu ahụ nke o binyere aka n'oge ọgbakọ ime obi ọchịchị ya e nwere ụbọchị Monde abalị 29 nke ọnwa Julaị afọ 2024 na-abịa dịka Gọọmentị Etiti na otu jikọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress(NLC) nwechara nkwekọrịta nke so abụbọọrụ na ndọrịtaụka ha nwere ọtụtụ izu.

Ebe foto si, Bola Tinubu/X
Gịnị bụ ụgwọọnwa opekata mpe?

Ebe foto si, CBN
Ụgwọọnwa opekatampe bụ ụgwọ pekasịrị e nwere ike ịkwụ onye ọrụ nke onye were mmadụ n'ọrụ agaghị agbada karịa, dịka onye ọkachamara n'okwu gbasara ọrụ na ndị ọrụ (HR) bụ Ulari Nwaogazie si kọwaa.
Otu ọrụ mba ụwa bụ 'International Labour Organisation' kọwara ya dịka ụgwọ opekatampe onye nwe ọrụ kwesịrị ịkwụ onye ọrụ maka ọrụ nke a gaghị ewepụ ihe ọbụla ma ha nwee nkwekọrịta ịwepụ ya ihe.
Kemgbe afọ 2019, ụgwọọnwa opekatampe Naijiria bụ N30,000 mana e buliela ya ọ bụrụ N70,000.
Na nkwekọrịta ọhụrụ a, a ga na-ahazigharị iwu ahụ kwa afọ atọ.
Kedụ ihe a na-atụ anya na onye ọrụ oyibo ga na- anata n'ụgwọọnwa ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
N'ọrụ Bekee, N70,000 aghọọla ụgwọọnwa onye nọ n'ogogo ' Level 1, Step 1' nke bụ ogogo mbụ onye na-aba mbụ n'ọrụ Bekee.
Mana dịka onye omeiwu si Oyo steeti bụ Akin Alabi, sị kọwaa n'ozi o wepụtara n'ọbaozi ya na X, e nweghịkwa onye nọ n'ogogo ahụ ọzọ "
Ihe nke a pụtara bụ na ndị ọrụ oyibo ga-anatakarịa N70,000.
Otu onyenkuzi mahadum na mahadum 'University of Port-Harcourt' bụ Dr Stephen Anurudu kwuru na ụgwọọnwa opekatampe a pụtara na a ga atụkwasara ya N100,000 n'ego ụgwọọnwa ya.
Anurudu kwuru sị,“Oge m bụ 'Assistant Lecturer' n'ebe afọ 2019, A na m anata N95,000, oge ahụ ụgwọọnwa opekatampe bụ N30,000.”
Ugbua ọ nọzi n'ọkwa 'associate professor,' ụgwọọnwa opekatampe bụ N70,000 ọ na-atụ anya na ụgwọọnwa ya ga-abụ N700,000. Mana ọ na-ekwu na nke a enweghị ihe o zuru.
Ọ sịrị, “Ihe ọbụla pekarịrị otu nde naira na ọkara(N1.5 m) abụghị ụgwọọnwa na Naijiria nke taa." is not a salary in this present Nigeria.”
Kedụ ndị ga-eketa oke n'ụgwọọnwa opekata mpe ọhụrụ a?

Ebe foto si, NLC/Facebook
Ndị ọrụ gọọmentị etiti niile, nke steeti nakwa nke okpuru ọchịchị ga-erite erere n'ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ a.
Dịka onye ọkwaizu na onye nkuzi na ngalaba iwu na mahadum 'Usman Danfodio University, Sokoto' bụ Muhammad Mansur Aliyu kwuru sị, “Iwu ji ụlọọrụ dịka Gọọmentị Etiti, ụlọakụ, gọọmentị steeti, na nke okpuru ọchịchị ịkwụ ya dịka ikike nke Iwu Naijiria nyere Ụlọomeiwu si kwuo.
Kedụ ndị ọ gaghị eru aka?

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị ọrụ agaghị erite erere n'ụgwọọmwa opekatampe ọhụrụ a.
Ha gụnyere ndị ego a na-akwụ ha gbadoro ụkwụ n'ihe ha zụtara nakwa ndị na-arụrụ obere ụlọọrụ ọrụ.
Alabi , bụ onye omeiwu rụtụrụ aka na "iwu ahụ ejighị ndị anaghị arụ ọrụ oge nile (part time) maọbụ ndị ụgwọ ha gbadoro ụkwụ na ihe ha zụtara. Iwu ejighịkwa ụlọọrụ ọbụla enweghị ndị ọrụ ruru mmadụ 25."
Ọkaiwu Aliyu kọwakwara na iwu ahụ ejighị ndị nwere otu onye maọbụ abụọ na-arụrụ ha ọrụ n'ụlọ (domestic workers)
Ọtụtụ ndị na-arụ ụdị ọrụ a bụ ndị were ha ọrụ na-eji aka ha amapụta ego ole ha na-akwụ ndị ọrụ ha maọbụ ha akpa ya akpa.
Mana Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ Godwin Akpabio ekwuola na ụgwọnwa opekatampe ọhụrụ gbasakwara ndị ọrụ nile; ma ndị na-arụrụ gọọmentị ma ndị na-arụrụ ndị nọrọ onwe ha, gụnyere ndị odibo na ndị ọrụ ụlọ ndị ọzọ.
Ụgwọọnwa opekata mpe ọhụrụ ọ ga-emetụta ndị ọrụ abụghị nke gọọmentị (private sector)?
Eee na mba.
Ụlọọrụ ndị anaghị akwụrubu ụgwọọnwa opekatampe nwere ike ibulie ụgwọọnwa ha na-akwụ ndị ọrụ ha.
Mana ndị welierela ụgwọọnwa karịa ụgwọọnwa opekatampe dịka oke ọnụahịa ihe rịa n'elu ọjị ka e wepụchara ego nkwụbilata ego mmanụ ụgbọala nwere ike ha agaghị ebuli ya .
Ọkacharmara n'okwu ọrụ bụ Ulari Nwaogazie, sịrị na mbuli ụgwọọnwa opekatampe apụtaghị na a ga-etinyere ndị ọrụ abụghị nke gọọmentị ego n'ụgwọọnwa ha.
Nwaogazie bụ onyeisi ụlọọrụ 'Myrtle Management Consulting' sịrị, “N'ihi mgbali ọnụahịa, ọtụtụ ụlọrụ na-abụghị nke gọọmentị ji agbata pasent 20 na 35 bulie ụgwọọnwa ha, ebe ụfọdụ tinyere ohere isi n'ụlọ arụ ọrụ mgbe ụfọdụ ma tinyekwa ego nkwado ego ụgbọaqla."
Mana o kwupụtara atụmuche na ọ gaa n'ihu na itinye ego n'ụgwọọnwa ga-ebute ịchụ n'ọrụ dịka ụfọdụ ndị nwe ụlọọrụ ga-agbalị ibelata ego ha na-emefu ịhụ na ọrụ na-aga.
Ego ole ka ndị 'cọrper ' ga na-erizi?

Ebe foto si, NYSC/Facebook
Oge gara aga, ndị ji otu afọ efe ala nna ha na-eri ụgwọọnwa opekatampe agbakọnyere otu ụzọ n'ụzọ iri(minimum wage +10%)
Oge ụgwọnwa opekatampe bụ ₦18,000, a na-akwụ ha ₦19,800.
Oge ụgwọọnwa opekata mpe gbaliri rue ₦30,000, ego gbaliri rue ₦33,000.
O si etu ahụ gaa n'ihu, ị mara na e nwere ike ịkwụ ha N77,000 dịka ụhg=gwọọnwa opekatampe ugbua bụzị N70,000.
Otu onye ọrụ 'National Youth Service Corps (NYSC) achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na usoro ikwubi ego ole a ga-akwụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha dịịrị onyeisiala.
"Anyị edeghara gọọmentị Etiti akwụkwọ rịọ ka ebulie ego ha ma ebulie ụgwọọnwa opekatampe.
"Ya mere, ibinye aka onyeisiala dị mkpa tupu ee tinye ego n'ụgwọnwa ndị ji otu afọ efe ala nna ha."
Kedụ steeti etinyebeghị ụgwọ ọnwa opekatampe N30,000 ochie?

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nchọpụta nke ụlọọrụ na abụghị nke gọọmentị bụ BudgiT, wepụtara na ngwụcha afọ 2023 gosiri na steeti 15 na Naijiria etinyebeghị iwu N30,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe kemgbe afọ 2024.
Ha gụnyere Abia, Bayelsa, Delta, Enugu, Nasarawa, Adamawa, Gombe, Niger, Borno, Sokoto, Anambra, Imo, Benue,Kogi na Taraba steeti.
Ọkaiwu Aliyu kwuru na nke megideere Iwu Naijiria n'ebe ọ dị ukwuu ma bụrụ ihe ruru ndị omeiwu iji maka ya chutuo gọvanọ n'ọkwa ya.
"Ụlọọrụ na abụghị nke gọọmentị nwenwuru ike ịkpụpụ ndị gọvanọ ụlọikpe ka ụlọikpe manye ha imezu ihe iwu kwuru."
O kwukwara na ndị ọrụ anaghị akwụrụ ụgwọnwa opekata mpe nwekwara ikike ịgba akwụkwọ n'ụlọikpe pụrụ iche maka ndị ọrụ 'National Industrial Court' maọbụ wegara Mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ mkpesa.
Otu onye ọrụ Bekee n'Abịa steeti nọ n'ogogo Level 10' bụ onye steeti ya akwụghị N30,000 kwupụtara olile anya na ọnọdụ ahụ ga-agbanwe ugbua.
Mana nwaamadi ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya na-atụ uche na ego ahụ etinyere agaghị eme ka ọnọdụ ndụ ya gbalite karịa ka ọ dị n'afọ 12 gara aga oge ọ banyere ọrụ Bekee.
Ọ na-enye m obi mwute ịna ụgwọọnwa N50,00, ebe ndị ogbo m na steeti ndị ọzọ na-anata ihe karịrịrị ya."
Oge o malitere ọrụ n'afọ 2012, dịka onye nọ n'ogogo Level 8, ụgwọọnwa ya bụ N42,000, mana ugbua, oge ahụ, otu akpa osikapa bụ N8,000.
“Mgbe ahụ, ụgwọọnwa na-azụtali akpa osikapa ise, mana ugbua ka afọ 12 gachara, ụgwọ ọnwa agaghị azụli otu akpa osikapa."












