"Ihe m ga-abigara n'ute ọrịa Hepatitis C ma gbakee"
Mmadụ abụọ rịara ọrịa ịba ọcha n’anya a kpọrọ Hepatitis C akọwaala ihe ha gabigara n’ọrịa a tupu ha agbake.
Otu n’ime ha bụ Adeola Joshua kwuru na mgbe ọ chọpụtara na o nwere ọrịa ịba ọcha n’anya a na ọ dị ya ka ụwa ọgwụla.
“Mgbe mbụ m chọpụtara na n were ọrịa Hepatitis C, ọdị m ka ụwa ọgwụla.”
Onye nke ọzọ bụ Orimoloye Oluwaseun kwuru na enyi ya nwaanyị gwara ya na o nwere obi ọjọọ maka na ọ gwara ya ka ọ bịa ka ha dinaa na-agbanyeghi na o nwere ọrịa Hepatitis C.
“Enyi m nwaanyị gwara m na obi tara m mmiri maka m nwere ọrịa Hepatitis C ma chọọ ka mụ na ya dinaa.”
Ha gara n’ihu nye ndị nwere ọrịa a ndụmọdụ ka ha gbalịa na-ekwupụta okwu ma nwee ike ịnata enyemaka.
“Na mmadụ nwere ọrịa a apụtaghị na ụwa onye ahụ agwụla.”
Onye dọkịta kwuru na e nwere ọrịa a ụdịrị ise dị iche iche gụnyere Hepatitis A, B, C, D na E.




