"Ihe m ga-abigara n'ute ọrịa Hepatitis C ma gbakee"

Aha onyonyo, Etu anyị si rịa ma gbakee n’ute ọrịa Hepatitis C
"Ihe m ga-abigara n'ute ọrịa Hepatitis C ma gbakee"

Mmadụ abụọ rịara ọrịa ịba ọcha n’anya a kpọrọ Hepatitis C akọwaala ihe ha gabigara n’ọrịa a tupu ha agbake.

Otu n’ime ha bụ Adeola Joshua kwuru na mgbe ọ chọpụtara na o nwere ọrịa ịba ọcha n’anya a na ọ dị ya ka ụwa ọgwụla.

“Mgbe mbụ m chọpụtara na n were ọrịa Hepatitis C, ọdị m ka ụwa ọgwụla.”

Onye nke ọzọ bụ Orimoloye Oluwaseun kwuru na enyi ya nwaanyị gwara ya na o nwere obi ọjọọ maka na ọ gwara ya ka ọ bịa ka ha dinaa na-agbanyeghi na o nwere ọrịa Hepatitis C.

“Enyi m nwaanyị gwara m na obi tara m mmiri maka m nwere ọrịa Hepatitis C ma chọọ ka mụ na ya dinaa.”

Ha gara n’ihu nye ndị nwere ọrịa a ndụmọdụ ka ha gbalịa na-ekwupụta okwu ma nwee ike ịnata enyemaka.

“Na mmadụ nwere ọrịa a apụtaghị na ụwa onye ahụ agwụla.”

Onye dọkịta kwuru na e nwere ọrịa a ụdịrị ise dị iche iche gụnyere Hepatitis A, B, C, D na E.