Hepatitis: Ọrịa Hepatitis A, B, C, D na E ha enwere ngwọta?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ọrịa Hepatitis na-egbu otu onye n'ime tịmkọm tịmkọm iri atọ (30 seconds) ọbụla, n'akụkụ ụwa niile.
Nke a bụ dịka ngalaba 'World Health Organisation' siri kwuo, n'akwụkwọ ozi ha wepụtara iji maa ọkwa maka ụbọchị ncheta ọrịa Hepatitis nke afọ 2021.
Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Julaị ọbụla ka a na-eme ncheta a.
Isiokwu emume nke afọ a bụ "Hepatitis anaghị eche mmadụ", nke a bụ iji gosi na ọ dị mkpa mmadụ ichekwa onwe ya.

Ebe foto si, WHO
BBC Igbo edebuola akụkọ kọwara maka ọrịa Hepatitis nke ọma, pịa aka ebe a.
Mana akụkọ nke a bụ iji kọwaa ndịịche dị n'ụdị ọrịa Hepatitis dị icheiche e nwere nakwa etu ị ga-esi chekwaa onwe gị.
Hepatitis A, B, C, D na E - Kedụ etu ha siri yie?

Ebe foto si, Getty Images
Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ maka ụdị ọrịa Hepatitis ọbụla bụ na ha ncha na-emetụta umeji mmadụ (Liver).
Njirimara ha, nke bekee na-akpọ symptoms na-abụkarị otu ụdị ihe mana ọ bụ nnyocha ga-egosi kpọmkwem ụdị nke mmadụ nwere.
Njirimara ndị a gụnyere:
- Anya na ahụ mmadụ ịcha uhie uhie (jaundice)
- Mamịrị ịcha edo edo (yellowish urine)
- Ahụ ọkụ
- Oke ike ọgwụgwụ
- Akwara igbu mgbu (muscle aches)
Ka anyị tulezie ndịiche dị na ụdị Hepatitis e nwere.
Hepatitis A (HAV)
- Ebe e si ebutekarị nje HAV bụ nke na-akpata 'Hepatitis A' bụ site n'iri nri maọbụ ịṅụ mmiri na-adịghị ọcha, ịṅụfe mmanya na-aba n'anya oke, nakwa okirikiri na-adịgh ọcha.
- Ọ bụrụ na onye nwere nje ahụ sie nri na-akwọchaghị aka ya nke ọma, o nwere ike ifere onye ọzọ riri nri ahụ.
- Mmadụ nwekwara ike ibute ya site n'ịmetụ nsị onye nwere nje ahụ aka.
- Mana 'Hepatitis A' anaghị akpacha ike dịka umunne ya ndị ọzọ.
- Onweghị ọgwụ, kama ọ na-eji aka ya ala ma obere oge gachaa.
Iji chekwaa onwe gị:

Ebe foto si, Iwaria
Dịka WHO siri nye ntuziaka, ụzọ ị ga-esi gbochie Hepatitis A gụnyere:
- Gbaa ọgwụ mgbochi HAV.
- Sie nri gị ka o ghee eghee nke ọma tupu i rie.
- Rie nri gị oge ọ dị ọkụ.
- Ị gachaa mposi, maọbụ ịgbanwee akwa mposi nwatakịrị, sachaa aka gị nke ọma
- Tupu ị rie akwụkwọ nri maọbụ taa mkpụrụosisi ọbụla, sachaa ya nke ọma
- Kpachara anya ụdị mmiri ị na-aṅụ
Hepatitis B

Ebe foto si, Getty Images
Nke a so n'otu ụdị Hepatitis kacha anụ ndị mmadụ ịkpakwụ n'ụwa niile.
WHO na-ekwu na mmadụ puku narị asatọ na iri abụọ (820,000) nwụrụ n'ihi orịa a naanị n'afọ 2019.
Hepatitis B so n'ọrịa kacha akpata ọrịa akpụ umeji (liver cancer).
Etu e si ebute ya bụ:
- Nne na-ebufe ya nwa oge a na-amụ nwa
- Mmekọ nwoke na nwaanyị
- Itinyere mmadụ ọbara nwere ya bụ nje
- Asụ mmiri, ọbara nsọ nwaanyị, ughe nwoke (sperm)
- Ntụtụ maọbụ ihe ndị ọzọ dị nkọ nke nje ahụ metụrụla
Ọ bụrụ na mmadụ bute nje a n'okenye, ọ na-aka njọ karịa onye butere ya na nwata.
Iji chekwaa onwe gị:
- Gbaa ọgwụ mgbochi HBV. Ụmụaka a mụrụ ọhụrụ kwesịrị ịgba ya n'ime otu ụbọchị a mụchara ha
- Zeere anwụrụ ike, ọ kachasị ndị ndị e ji ntụtụ agbanye n'ahụ
- Kpachara anya onye gị na ya na-eme aramara. Zeere gị na ọtụtụ ndị mmadụ ime aramara
- Zeere ise ihe osise n'ahụ (tatoo), maka na ihe e ji ese ya na-aghọ nkọ
Hepatitis C
Ọ bụ n'afọ 1972 ka ndị nnyocha sayensị atọ: Michael Houghton, Harvey Alter na Charles Rice chọpụtara nje a.
Nchọpụta a ka e ji nye ha nturuugo 'Nobel Prize in Medicine' n'afọ 2020.
- Ọ bụ n'ọbara ka e sikarị ebute ụdị Hepatitis nke a.
- Nke a gụnyere ịnata ọbara bu ya bụ nje, maọbụ iji ntụtụ metụrụla onye nwere ya bụ nje gbaa
- Mmekọ ọbụla nke ọbara nwere ike ịdị na ya, dịka nwoke na nwoke inwe mmekọ
- A naghị aṅụta ya na mmiri ara, maobụ nri maọbụ mmiri maọbụ mmekọarịta ahụ dịka ibi ọma maọbụ ịmị ọnụ.
Iji chekwaa onwe gị:
- Ọ bụrụ onye ahụ siri ike, ahụ ya ga-ebusonwu nje a agha n'egbughị oge ọ laa.
- Ya mere o jiri dị mkpa ka mmadụ na-eri nri na-ewulite ihe na-ebuso nje agha n'ime ahụ, nke bekee na-akpọ 'immune system'
- Tupu ọrịa aka njọ, gbaga ụlọọgwụ gaa nata ọgwụgwọ.
- Nje HCV na-akpata Hepatitis C enwebeghị ọgwụ mgbochi
Hepatitis D

Ebe foto si, Getty Images
Hepatitis D na-emekarị naanị ndị nwere maọbụ ndị rịabugoro ọrịa Hepatitis B.
Mgbe ọ dị otu a, a na-akpọ ya 'coinfection'.
Ụzọ kacha mfe esi egbochi ya bụ ịgba ọgwụ mgbochi nke Hepatitis B.
WHO kwuru na ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje a na-agbada agbada n'ihi na ọgwụmgbochi Hepatitis B dị ebe niile.
Hepatitis E

Ebe foto si, Iwaria
A na-ebutekwa ụdị nje nke a site n'ịṅụ mmiri adịghị ọcha, ọ kachasị nke nsị banyere n'ime ya.
Ọ bụ mba na-emepechaghị emepe ka ụdị Hepatitis nke a kacha enye nsogbu, dịka WHO siri kwuo.
Hepatitis E nwere ọgwụ mgbochi nke ndị mba Chaịna rụrụ. Naanị na mba ahụ ka ị ga-enweta ya bụ ọgwụ.
Mana ọrịa a na-eji aka ya ala n'ime abalị isii maọbụ asatọ nje ya jiri banye n'ahụ mmadụ
Iji zeere ya:
- Hiee aka abụọ n'anya maka mmiri ịmaghị ebe o si.
- Zekwaara ọkpụrụkpụ mmiri (ice block) ị na-amaghị mmiri e ji mee ya











