Water-Borne Diseases: Kedụ ndịiche dị n'ọrịa 'cholera', 'diarrhea' na 'dysentery'?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Mmiri adịghị ọcha na-ebute ọrịa dị icheiche nwere ike iduba mmadụ n'ọnwụ erughị eru.
Ị ma na ọrịa dịka afọ asịsa, disentrị, taịfọd, polio wdg. bụ ọrịa na-esite na mmiri adịghị ọcha nke nwere ike ịnapụ mmadụ ndụ ya?
Iji maa atụ: WHO kwuru na afọ ọsịsa sitere na mmiri adịghị ọcha na-ebute ọnwụ mmadụ ruru narị puku ise kwa afọ.
Ọ na-atụ gị na-anya? Mata na inweta ezigbo mmiri ọnụnụ dịka iji abalị achọ ewu ojii na mpaghara Naijiria dị icheiche, tinyere Ọwụwwa Anyanwụ.

Ebe foto si, Getty Images
WHO kwuru na mmadụ dị otu ijeri na ụma asatọ (1.8bn) na-aṅụ mmiri nsị bara n'ime ya n'akụkụ ụwa dị icheiche.
Mana ihe onye ma anaghị abụ ya okenye, lee ihe ndị ikwesịị ịma maka ọrịa ndị na-esi na mmiri anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ:
1. Afọ ọsịsa

Ebe foto si, EPA
O were ewu na ọkụkọ anya na ụkọ mmiri nwere ike ibutere ndị mmadụ afọ ọsịsa.
Mana ihe ụfọdụ amaghị bụ na ọrịa a, nke ọtụtụ anaghị akpọ ihe, nwere ike igbu mmadụ na-egbughị oge.
Afọ ọsịsa, nke Bekee kpọrọ 'cholera' bụ ọrịa a na-ebute site na iri nri maọbụ ịṅụ mmiri nke nje nọ na ya.
Dịka WHO si kọwaa, afọ ọsịsa nwere ike igbu mmadụ awa ole ma ole o jiri malite ya ma ọ bụ na onye ahụ enwetaghị nleta.
Ha kwuru na kwa afọ ọ na-egbu mmadụ dị 21,000 rue 143,000.
Njirimara cholera
- Ịnyụ nsị gbara oke mmiri dịka mmiri osikapa
- Ọgbụgbọ
- Agụụ mmiri
- Ụkwụ mgbu
- Afọ ịfụ ụfụ
- Mgbakasị ahụ
Kedụ ndịiche dị n'etiti 'diarrhea', 'cholera' na 'dysentry'"

Ebe foto si, Getty Images
E kwube okwu ọrịa afọ ọsịsa, ọtụtụ oge, mgbagwojuanya na-adị dịka ndị mmadụ amaghị nke bụ nke n'etiti ọrịa atọ metụtara ọwa nri n'ihi na ha yiri onwe ha; 'cholera', 'diarrhea' na 'dysentry.'.
Ha atọ yiri mana ha abụghị otu.
'Diarrhea' bụ aha Bekee na-akpọ ọrịa afọ ọsịsa niile ebe nsị mmadụ gbanwere etu ọ na-adị.

Dkta Odubanjo kọwara dịka, " Mgbe e nwere mgbanwee na nsị; ọ gbaa mmiri karịa maọbụ mmadụ na-agba nje ịnyụ nsị karịa etu ọ na-anyụbu."
Ọ bụrụ na onye na-anyụbu isi otu ugboro n'ụbọchị nyụwa ugboro ise maọbụ isii."
'Cholera'
N'aka nke ọzọ, cholera nke Igbo na-akpo 'otoro' bụ 'diarrhea' nke nsị onye ọ na-eme na-anyụ gbara oke mmiri nke ọ nje a kpọrọ 'vibrio cholerae' na-ebute.
Dịka Dkta Odubanjo sịrị kọwaa etu e si ama ya iche, ọ sịrị, "Nsị onye ọ na-eme nwere isi dị iche ma nwekwa ka ọ na-adị oke mmiri mmiri, nke mere e ji akọwa ya dịka mmiri osikapa."
"Onye ọ na-asa nwere ike ,na-egbughị oge ọ gaghị amazi onwe ya, ya nwụọ."
Ọgwụgwọ: Nke a bụ n'ihi na mmiri na-abụ onye ọrịa arịa kwam kwam n'ahụ. Ya mekwara ndị dọkịta na-enyekarị onye ahụ mmiri nwere nnu na shuga iji nwetakwa mmiri pụrụ onye ahụ n'ahụ.
E nwekwara ọgwụ mgbochi ọrịa otoro.
'Dysentery'

Ebe foto si, Getty Images
'Dysentery' bụ ụdị 'diarrhea' nke nsị na-enwe ọbara dị ya nke nje a kpọrọ 'shigella' na-ebute..
"Ọ bụ afọ ọsịsa nke nsị na-adị nro ma nwekwa ọbara n'ime ime ya."
Njirimara ndị ọzọ gụnyere; afọ ịfụ ụfụ, ahụ ọkụ na afọ ọrụrụ.
Dịka WHO siri kwuo, ọtụtụ ihe nwere ike ibute 'dysentrị dịka nje, bacteria, virus maọbụ kemikal.
Dkta Odubanjo kwuru na mgbe ụfọdụ afọ ọsịsa nwere ike ịbụ ngosi ọrịa ọzọ dịka ọrịa ọnya afọ (ulcer) maọbụ kansa mgbụrị afọ (colon cancer).
Ọ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gaa ụlọọgwụ mgbe ọbụla ha nwere afọ ọsịsa iji mata nje maọbụ ihe butere iji mata ụdị ọgwụ e kwesịrị ịṅụ.

Igbo na-ekwu na mgbochi ọrịa kacha ọgwụgwọ, e mee ngwa ngwa, e meghara ọdachi.
Ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na ọ ka mma idebe onwe na gburugburu ọcha, ịṅụ ezigbo mmiri ma ịkpachapụrụ nri onye na-eri anya so n'ụzọ e ji agbalahụ ọrịa pịrịpịrị a na-ebute na mmiri. ọzọ.
3. Taịfọd
Dọkịta Ikechukwu Okafor kwuru na a na-enweta ọrịa Taifọd "site n'ịịnụ mmịrị adịghị ọcha, iri nri fọtara afọta maọbụ nrị akwọghị aka sie."
Njirimara Taifọd
- Ahụ mgbu
- Ike ọkwụkwụ
- Oke ọsịsọ ịgba mmadụ
- Afọ ọsịsa maọbụ afọ isi ike
A na-agwọ onye ọrịa taifọd ji site na ịgba maọịbụ ịṅụ ọgwụ antibayọtịks dịka dọkịta siri nye ntuziaka.
N'aka nke ọzọ, iji gbochie ajọ ọrịa, ndị ọkammụta ahụike na-adọ aka na ntị ka ị gbaara ịṅụ mmiri adịghị ọcha ọsọ, erila nri n'iro.
Ọrịa taịfọd nwekwara ọgwụ mgbochi nke mmadụ nwere ike ịgba iji gbochie ibute ya bụ ọrịa.
4. Ọrịa ntụrịọkpa

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa ntụrịọkpa bụ ọrịa na-efe ezigbo ofufe nke na-arịakarị ụmụaka erubeghị afọ ise.
Dịka WHO siri kwuo, a na-ebute ọrịa site na nri maọbụ mmiri adịghị ọcha bụ nke nsị maọbụ mmiri nsị metụrụ.
Ọ gbajuo dọrọ, ọrịa nwere ike ịkpọnwụ nwata ahụ ọkachasị ụkwụ bụ ihe mere Igbo jiri nye ya aha ahụ bụ "ntụrịọkpa".
WHO sị na ọrịa ntụrịọkpa na-eme ka otu nwata n'ime ụmụaka 200 ọbụla butere ọrịa nwere nkpọnwụ ahụ abụghị ịgwọ agwọ.
N'ime ndị ọrịa a kpọnwụrụ ahụ, pasent ise rue pasent iri(5%-10%) na-anwụ ma mkpọnwụ ahụ ahụ metụta akụkụ ahụ ebe e ji eku ume.
Njirimara 'polio'
- Ahụ ọkụ
- Ọgbụgbọ
- Ike ọgwụgwụ
- Akpịrị ịkpọnwụ
- Ụfụ n'aka na ụkwụ
Ọgwụgwọ ya
Anaghị agwọ ọrịa ntụrị ọkpa agwọ kama e nwere ike ịgba ọkwụ iji gbochie ya.
Dọkịta ahụike ọha bụ Doyin Odubanjo sị na o kwesịghị ka okwu ọrịa ntụrị ọkpa na-amapụ ndị mmadụ ume n'ihi na Naijiria ekpochapụla ya bụ ọrịa.
WHO na Unicef kpọpụtara Niaijiria dịka obodo enweghkwa ọrịa ntụrịọkpa n'abalị 25 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2020.
Nke a mere Naijiria mba ikpeazụ n'Afrịka na-anapụta onwe ha n'aka ọrịa na-eme ụmụaka ịwa.
5.'Guinea worm'

Ebe foto si, Science Photo Library
Nke a bụ ọrịa okpo "Guinea-worm' nke njem 'Dracunculus medinensis" na-ebute ma mmadụ ịṅụ mmiri adịghị ọcha e chutere n'ụm,ị maọbụ obere ngene.
Akwa okpo ahụ banye ime arụ mmadụ, ọ na-amụba malite na-agbawa ụkwụ onye ọ na-eme.
Dkta Odubanjo kwuru na "ụfụ Guinea worm dịka okpo ndị ahụ na-agbawa ahụ onye ọ na-eme na-arịpụta na-emekpa onye o ji aka rinne."
N'etu o si ekesa, ọ sịrị" O si na mmiri ọnụnụ banye gị na-arụ, ụfụ ya jide gị itinye ụkwụ na mmiri ka ọ jụnata gị oyi, nje ahụ abanye na mmiri onye ọzọ kuru mmiru ahụ ghọọ o butekwa ya bụ ọrịa."
N'uche Dkta Odubanjo, o kwesịghị ka a na-etinyezi uche n'ọrịa 'guinea worm' na 'polio' dịka o kwuru na e kpochapụla ya na Naijiria.














