Petroleum Industry Bill: Ọ gịnị bụ PIB a onyeisiala Muhammadu Buhari debanyere n'iwu?

Ebe foto si, Femi Adesina
Femi Adesina bụ ọnye ndụmọdụ pụrụiche onyeisiala Naijirịa edepụtala akwụkwọ ozi were sị na onyeisiala Muhammadu Buharị edebanyela iwu Petroleum Industrial Bill n'iwu Naijirịa.
O kọwara na ọ bụ dịka Buhari dopuru onwe ya iche dịka iwu covid-19 siri kwuo maka ndị mere njem ka ọ debanyere ya bụ iwu n'akwụkwọ iwu Naijirịa.
Adesina kwuru sị, "Mmemme maka ya bụ iwu ọhụrụ ga-ebido n'ụbọchị wenezde dịka oge ndopu iche ya gwụchara".
Ọ kọwara na ndị omeiwu ukwu wepụtara ya bụ iwu ka atulee n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Julaị 2021, ebe ndị ụlọ omeiwu nta wepụtara ya bụ iwu n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Julaị 2021, nke a mere ka ihe echewere kamgbe mbido afọ ndị 2000 bịa na mmezu.
Ihe dị mkpa i kwesịrị ịma maka iwu 'Petroleum Industry Bill'

Ebe foto si, Getty Images
N'ụbọchị Tọzde, abalị mbụ nke ọnwa Julaị afọ 2020, ụlọomeiwu Naịjirịa - nke ukwu na nke nta - binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Petroleum Industry Bill' maọbụ PIB n'ịchafụ.
Ọ bụrụ na Onyeisiala Muhammadu Buhari kwadoo iwu a, ọ ga-abụzi iwu ga na-achịkọta mmepụta nakwa ire mmanụ agbịdị na Naịjirịa.
Ọtụtụ na-ekwu na nke a bụ otu ọkpụrụkpụ ihe nke ndị omeiwu mepụtarala.
Mana ndị ọzọ na-ajụ sị, "gịnị bụ PIB?"
Nkọwa maka PIB

Ebe foto si, Getty Images
Mmanụ agbịdị - maọbụ 'crude oil na bekee - bụ otu ngwaahịa kacha enye Naịjirịa ego.
Ya mere o ji dị mkpa na a ga-enwe iwu doro anya na-ahụ maka mmepụta ya bụ mmanụ.
Ka ọ dị ugbua, iwu na-achịkọta mmepụta na orire mmanụ na Naịjirịa bụ nke a kpọrọ 'Petroleum Act' nke afọ 1969 nakwa 'Petroleum Profit Tax (PPT) Act 1959'.
E nwekwara ụmụ kịrịkịrị iwu ndị ọzọ na-ahụ maka ngalaba dị icheiche dị na mmepụta mmanụ.
Mana n'ihi mgbanwe nke na-apụta ihe kwa ụbọchị, ọ dị mkpa ka e nwee iwu ọhụrụ zuru oke nke ga-ahụ maka ọdachi niile si na mmepụta mmanụ.
Ọdachi ndị a gụnyere:
- Mmebi okirikiri ebe a na-egwupụta mmanụ
- Mpụ na nrụrụaka
- Ọrụ dịịrị ụlọọrụ na-emepụta mmanụ
- Ihe kwesịrị irute obodo ndị mmanụ dị na be ha, wdg.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ Olusegun Obasanjo tụpụtara alo iwepụta iwu PIB n'afọ 2000, mana ọ bụ Musa Yar'Adua wegara iwu a n'ụlọomeiwu Naịjirịa n'afọ 2008
Kamgbe ahụ ruo taa, Naịjirịa enweela ndị isi ala anọ, mana iwu PIB enwebeghị isi.
Oge Buhari batara n'ọchịchị, o kere PIB ụzọ anọ. Ha bụ:
- 'Petroleum Industry Governance Bill' - PIGB
- 'Fiscal Regime Bill'
- 'Upstream and Mainstream Administration Bill', na
- 'Petroleum Host Communities Bill'

Ebe foto si, BUKOLA SARAKI/FACEBOOK
Na 2017, ụlọomeiwu nta binyere aka n'iwu PIGB. Ndị Sineti binyekwara ya aka n'ọnwa Jenụwarị 2018.
Mana Onyeisiala Buhari akwadoghị ya bụ iwu tupu agba nke mbụ ọchịchị ya abịa n'isi njedebe na 2019.
N'ọnwa Sepụtemba 2020, Buhari wegara iwu PIB ọhụrụ n'ụlọomeiwu ka ha lebaa ya anya.
Ọ bụ iwu nke a ka ndị omeiwu kwadoro n'ụbọchị Tọzde.
Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'iwu PIB nke a

Ebe foto si, AFP
- NNPC agaghị abụzị ụlọọrụ gọọmentị nwe, kama ọ ga-abụzi ụlọorụ onwe (private limited company) nke ndị mmadụ nkịtị nwere ike ịzụta oke n'ime ya.
- Pasentị iri atọ n'ime ọmụrụnwa NNPC ka a ga-eji na-achọkwa mmanụ agbịdị n'akụkụ dị icheiche na Naịjirịa.
- Ndị obodo mmanụ dị na ya ga-enweta pasentị ise maọbụ pasentị atọ n'ime ego si na mmanụ ahụ
- Ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbịdị ga-ahụ maka mmezi ihe ọbụla mebiri n'okirikiri ebe ha na-arụ ọrụ
- Ọ ga-eme ka o doo anya ụtụisi ego ole ụlọọrụ na-egwupụta mmanụ ga na-akwụ gọọmentị












