Chimamanda Ngozi Adichie: Ọ bụghị omenala Igbo ka nwaanyị gbanwee aha ya ma ọ lụọ dị
Mgbe nwaanyị lụrụ di n'ala Igbo maọbụ n'ụfọdụ ebe na Naijiria, ọ na-agbanwe aha nna ya zawazie aha di ya.
Nke a bụ omenala ụfọdụ ndị mmadụ pụtara ụwa hụ ka a na-eme ya.
Mana Chimamanda Adiche bụ nwa Igbo ji eme ọnụ nke a ma ama n'ụwa niile dịka ọkaibe n'ide akwụkwọ, ekwenyeghi n'omenala a.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'afọ 2018, ọ kọwara na nke a abụghị omenala Igbo, kama na ọ bụ omenala Igbo mụtara amụta.
Adiche alụọla di mana ọ gbanweghi aha ya zawa nke di ya.
O kwuru na ọ hụrụ aha ya n'anya nke ukwuu.
Chimamanda bụ onye Abba dị n'Anambra steeti n'Okpuruọchịchị Njikọka mana odocheghị anya ebe di ya bụ Ivara Esege sị.
Ụfọdụ sị na a mụrụ ya n'Enugu steeti mana ọ bụghị onye Igbo.
Mana nke doro anya bụ na ọ bụ onye Naịjirịa ma bụrukwa onye British-America, bụrụkwa dọkịnta Bekee.
Gee nkọwa ya n'uju: