Chimamanda Ngozi Adichie: Ọ bụghị omenala Igbo ka nwaanyị gbanwee aha ya ma ọ lụọ dị

Aha onyonyo, Ọ bụghị omenala Igbo ka nwaanyị gbanwee aha ya ma ọ lụchaa dị - Chimamanda Adiche

Mgbe nwaanyị lụrụ di n'ala Igbo maọbụ n'ụfọdụ ebe na Naijiria, ọ na-agbanwe aha nna ya zawazie aha di ya.

Nke a bụ omenala ụfọdụ ndị mmadụ pụtara ụwa hụ ka a na-eme ya.

Mana Chimamanda Adiche bụ nwa Igbo ji eme ọnụ nke a ma ama n'ụwa niile dịka ọkaibe n'ide akwụkwọ, ekwenyeghi n'omenala a.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'afọ 2018, ọ kọwara na nke a abụghị omenala Igbo, kama na ọ bụ omenala Igbo mụtara amụta.

Adiche alụọla di mana ọ gbanweghi aha ya zawa nke di ya.

O kwuru na ọ hụrụ aha ya n'anya nke ukwuu.

Chimamanda bụ onye Abba dị n'Anambra steeti n'Okpuruọchịchị Njikọka mana odocheghị anya ebe di ya bụ Ivara Esege sị.

Ụfọdụ sị na a mụrụ ya n'Enugu steeti mana ọ bụghị onye Igbo.

Mana nke doro anya bụ na ọ bụ onye Naịjirịa ma bụrukwa onye British-America, bụrụkwa dọkịnta Bekee.

Gee nkọwa ya n'uju: