Chimamanda Chukwudum: 'Ọrịa 'kidney' nna m dara, nne kwụsị ọrụ kpalirị m ịmụ nka 'pillow'

- Onye dere ya, Uche Akolisa and Kelechi Anozie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist, Video Journalist
O nweghị onye na-ahara ndị maọbụ ezinaụlọ ga-amụ ya.
Obere Nwaada Chimamanda Chukwundu gbara afọ 12 bụ onye Oko, n'Okpuru Ọchịchị Orumba-North dị n' Anambra steeti bụ nwata anya ya dị na ihe nka rinne.
Mana ọ bụ ihe isi ike dakwasịrị nne na nna ya mere ya afọ ole na ole gara aga mere o jiri tinyezi anya iji nka chụta ego.
Nna nwata ahụ bụ Eric Chukwudum bụbu ọzụahịa tupu o nwee nsogbu ma daa nnukwu ọrịa.
Nwa ada ahụ na-amụbu etu e si arụ akpụkpọ ụkwụ na ariri e ji awa akwa (belt)dịka ọ na-agụ akwụkwọ tupu ije ụwa ebuga ya n'ịmụ nka 'pillow'.
Ọ bụ oge ụlọakwụkwọ nyere ha ọrụ welaa ụlọ ịrụ ihe nka weghachita n'ụlọakwụkwọ, ọ rụrụ akwa nhibe isi pụrụ iche nke Bekee kpọrọ 'smocked throw Pillow', ha họrọ nke ya dịka nke kachasị mma.
Nne ya bụ Benita Chukwudum, onye na-arụ ọrụ 'Insurance'' malitere ibugharị nna ya ma sikwa ebe ahụ kwụsị ọrụ Bekee.
Ihe isi ike mere ka Chimamanda Chukwudum na ụmụnne ya kwụsị akwụkwọ, ọbụladị ka nwata ahụ a mụrụ na Legọsi na ndị ezinaụlọ ha gbaga Ogun steeti.

Nke a kpalitere ya itinye anya na ịmụ ya bụ nke a nke ọma, dịka o ziri gwa BBC Igbo na mkparịtaụka na nsonso a.
Mana ọ bụ mgbe nna ya daara n'akwa ọrịa nke mere ka nne ya kwụsị ọrụ Bekee na-aru, nke mere Chimamanda na ụmụnne ya kwụsị ịga akwụkwọ ka nwata ahụ chebere etu ọ ga-esi eji nka ya enweta ego ka o tinyere uchu na nka 'pillow' a kpara akpa.
Ugbua nwada ahụ si na irụ nka ya enweta ego e ji akwụrụ ya na ụmụ nne ya abụọ ndị ọzọ ụgwọ akwụkwọ.
Lee ihe ndị ọzọ ọ gwara BBC igbo maka ije ya n'ọrụ nka ya.







