Ụlọikpe ECOWAS ekwuola ka Benin Republic kwụọ Sunday Igbogho N26m

Sunday Igbogho

Ụlọikpe pụrụiche nke ECOWAS enyela mkpebi ka mba Benin Republic kwụọ Sunday Adeyemo a ma dịka Sunda Igbogho ụgwọ itiakan'obi.

Ha mere mkpebi a ma kwuo ka kwụọ Igbogho ego ruru nde CFA (ego mba ahụ) iri abụọ maọbụ ego naira nde iri abụọ na isii n'ime ọnwa atọ.

Cheta na Igbogho kpụpụrụ mba ahụ ụlọikpe n'akwụkwọ ọ gbara ha n'ọnwa Febụwarị maka nwuchi na njichi ya nke ọ sị ezighi ezi.

Ụlọikpe ahụ gwakwara mba Benin ha gba mbọ kwụọ ya bụ ụgwọ ma gosi ihe akaebe na ha kwụrụ ya.

A nwụchiri Igbogho na nwunye ya bụ Ropo na mba Benin Republic dịka ha na-agbapụ Naịjirịa mgbe DSS wakpochara be Igbogho n'ọnwa Jụlaị afọ 2021.

Sunday Igboho: Ebe ka onye ndu 'Yoruba Nation' nọ ugbua?

Sunday Adeyemo a ma ama dịka Sunday Igboho

Ebe foto si, Sunday Igboho/Instgram

Dịka akụkọ na a tọhapụla onye ndu otu 'Yoruba Nation' bụ Sunday Adeyomo a ma dịka 'Sunday Igboho' na mkpọrọ na mba Bene Rịpublik, gbara, ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ kedụ ebe ọ nọ ugbua?

Nnukwu ọkaiwu Yomi Aliyu (SAN) nakwa otu na ndị nnyemaka Sunday Igboho bụ Ademola Omiyale gwara BBC Yoruba na a tọhapụla that Sunday Igboho n'ezie nakwa na ọ nọ n'ụzọ ịgawa Jamịnị.

Gọọmentị mba Bene Rịpublik tọhapuru Sunday Igboho na nsonso a dịka ọ nọchara mkpọrọ afọ abụọ na mba ahụ.

Ọkaiwu Yomi Aliyu kwuru na o nweghị ihe gbochiri nwa amadi ahụ ịbata Naijiria dịka Gọọmentị mba Bene tọhapụrụ ya , sị na o nweghị okw=u o nwere na Naijiria.

Aliy u sịrị, " Ọ bụrụ na Bene sị ya lawa,na o mejọghị ha, o nwere ohere ịbata Naijiria ma ọ chọọ."

N'aka nke ọzọ, Omiyale kọwara sị, " E jichiburu ya nwaa oge na Bene, mana ugbua, Gọọmentị Bene apụtala kwuo na ha na ya enweghịkwa nsogbu na o nwere ohere ịhapụ ala ha."

Sunday Igboho: A tọhapụla onye ndu Yoruba Nation
Sunday Adeyemo aka Sunday Igboho

Ebe foto si, Sunday Igboho/Instagram

Nkọwa foto, Sunday Adeyemo a ma ama dịka 'Sunday Igboho' bụ onye ndu otu 'Yoruba Nation'.

Gọọmentị mba Bene Rịpublik atọhapula onye ndu otu nwere onwe ndị Yoroba a kpọrọ 'Yoruba Nation' bụ Sunday Adeyemo a ma ama dịka 'Sunday Igboho'.

A nwụchiri Sunday Igboho afọ abụọ gara aga n'ọdọụgbọelu mba ahụ dịka ọ nagba ọsọ ndụ ịgbaga Jamini dịka ndị nweojii nzuzo Naijiria wakporo ụlọ ya n'Ibadan ma gbuo otu onye.

Adeyemo bụ onye gbara ama nke a n'ozi o wepụtara na ọba ozi Instagram ya, kelere aka chịburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo, Wole Soyinka, Ọkammụta Banji Akintoye; onye ndụ otu Afenifere bụ Ayo Adebanjo na ndị eze ọdịnala maka inye aka na ịhụ na a tọhapụrụ ya.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Instagram post

Cheta na ndị ọrụ nchekwa mba Bene nwụchiri Sunday Igboho n'ọdọụgbọelu ha dịka ọ na-agba ọsọ ndụ site na Naijiria.

Nke a so mwakpo ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS n'ịchafụ wakporo ụlọ ya n'Ibadan,Oyo steeti maka ebubo na o dowere ngwa ọgụ.

Mwakpo ahụ sochiri oku Sunday Igboho kpọrọ ka e kepụta Ọdịda Anyanwụ na Naijiria dịka ọ malitere ọgụ megide ndị ọchịehi na ndị ntọ na-akpa mkpamkpa mpaghara ahụ.

E mechara tọhapụ Sunday Igboho nwa mgbe nta iji nye ya ohere ka o leta ahụike ya.