Nnamdi Kanu court case: Lee ihe ekpebiri n'ụlọikpe maka ikpe Nnamdi Kanu n'Abuja taa

Ọkaikpe nọ n’isi ikpe nke taa bụ Jummai Hanati kwuru na ọ ga ezigara ndị ọkaiwu ikpe a metụtara ozi pụtara mkpebi ya n’ikpe nke taa.
E yigharịrị ikpe ahụ nke malitere n'ebe elekere 10 nke ụtụtụ ma bie n'otu awa n'ọkara.
Mike Ozekhome bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu rịọrọ ka a tọhapụ ya o nweeike si n’ụlọ na-abịa ma kwuo na ahụike ya dara ada.
Ọ rịọkwara ka a kụchapụ ebubo ọhụrụ ndị nọ n’isi Kanu ma weghachite ndị nke ochie nọ n’isi ya n’afọ 2015 dịka o kwuru na ebubo ọhụrụ ndị a esoghị usoro iwu Naịjirịa nke gụnyere etu e siri wụchịe ya na Kenya mana ndị ọkaiwu na-anọchịteanya gọọmentị Naịjirịa bụ David Kaswe sara mkpesa ndị a ma kwuo na ya bụ mkpesa achịtaghị aja.
Ọ gara n'ihu rịọ ka ha kpechapụ ikpe ha dị n’ụlọikpe ukwu nke Abuja. Nke mere ọkaikpe a jiri bugharịa ikpe a.

Ndị ọkaiwu Nnamdi na-eme mkpesa ka a tọhapụ ya ka o siri n’ụlọ na-abịa ikpe ya.
Nke a bụ mkpesa ha mebụrụla n’oge gara aga nke a nabatabeghị.
Mkpesa ọkaịwu Ozekhome kọwara na ọ bụ ọsọ ndụ ya ka ọ na-agba mgbe a nwụchiri ya.
O mekwara mkpesa ka e tinyeghachịe ebubo ise e dobere n’isi Kanu mgbe a wụchịrị ya n’oge gara (2015) tupu a nwụchịe ya ọzọ n’afọ 2021 ma kụchapụ ebubo asaa nọ n’isi ya ugbua dịka o kwuru na a tọrọ Kanu n’ụzọ na-ezịghị ezi nke o kwuru na gọọmentị Kenya amaghị maka ya.

Ikpe Nnamdi Kanu amalitela ugbua agbanyeghị na ọ bịabeghị ụlọikpe.
Ndị ọkaiwu ya abụọ bụ Aloy Ejiofor na Mike Ozekhome awụchịela.
Ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị wụjuo ụlọikpe mkpegharị a dịka ha sị eme n’oge ikpe nke ụlọikpe ukwu Abuja.
Ọkaikpe nọ n’isi ikpe a akụchapụla mkepsa na-arịọ ka e kpee ikpe Nnamdi Kanu ngwa ngwa.

Taa bụ Tuzde, ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Sepụtemba afọ 2022 ka ụlọikpe mkpesa bụ 'Court of Appeal' ga-anụ ikpe dị n'etiti Mazi Nnamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa.
Ikpe nke taa bụ iji mara ma ụlọikpe ahụ a ga-akụchapụ ebubo asaa fọdụrụ n'ime ebubo iri na ise nke gọọmentị na-ebo Maazị Kanu.
Cheta na ikpe a kwesịburu ịdị n'abalị iri na otu nke ọnwa ọkutoba mana ụlọikpe mkpesa butekwuru ihu, dịka ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor si kwuo.
Obere ntọala maka etu ikpe a si malite

Ebe foto si, Getty Images
- Mazi Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra', nke bụ otu na-achọ nwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
- Mana gọọmentị Naịjirịa machiri otu IPOB ma kpọọ ha ndị oyi ndụ egwu.
- N'afọ 2015, ndị uweojii nzuzo nke Naịjirịa bụ 'Department of State Services' nwụchiri Mazi Kanu oge o si mba UK ebe o bibu lọbata.
- A kpụpụrụ ya ụlọikpe, n'ihu ọkaikpe Binta Nyako, n'ihi ebubo iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịchutu ọchịchị onye kwuo uche ya.

Ebe foto si, Gọọmentị
- E jichiri Mazi Kanu n'ụlọ mkpọrọ dị na Kuje, Abuja, ruo afọ 2017 dịka ikpe ya na-aga n'ihu, mana ụlọikpe mechara tọhapụ ya ka o sizie n'ụlọ na-abịa.
- Mana na 2017, Nnamdi Kanu gbara ọsọ na Naịjirịa dịka o kwuru na ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya igbu ya.
- Kamgbe ahụ, ikpe ya kwụsịtụrụ n'ụlọikpe Naịjirịa ruo ọnwa June 2021, mgbe a nwụchiri Kanu ọzọ na mba Kenya dịka o mere njem ebe ahụ.
- Gọọmentị Kenya kpụghachiri Kanu na Naịjirịa ebe e jichiri ya n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS ma malitekwa ikpe ya ọzọ.
Ebubo iri na ise ọhụrụ chere Nnamdi Kanu n'ihu n'ụlọikpe

Ebe foto si, Gọọmentị
Dịka ikpe a malitekwara ọzọ, gọọmentị Naịjirịa wetara ebubo iri na ise ọhụrụ n'ụlọikpe.
Ebubo ndị a gụnyere:
- Ịgbasa ozi iyi ndụ egwu na Naịjirịa
- Inye iwu ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ (sit-at-home)
- Ịbụ onye otu IPOB nke bụ otu iwu machiri amachi
- Inye iwu ka ndịị mmadụ wakpo ndị ọrụ nchekwa ma gbuo ha.
- Inye iwu ka ndị mmadụ wakpo ezinụlọ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa
- Inye ndị mmadụ iwu ka ha wakpo ndị uweojii Naịjirịa nakwa ụlọọrụ ha
- Inye ndị mmadụ iwu ka ha gbuo onye uweojii Naịjirịa ọbụla ha hụrụ
- Inye ndị otu ya iwu ka ha rụọ ogbunigwe nke ha ga-eji wakpo ndị ọrụ nchekwa.
- Inye ndị mmadụ iwu ka ha ghasaa ntuliaka a na-achọ ime n'Anambra steeti
- nye ndị mmadụ iwu ka ha mebie ụlọ na akụrụngwa gọọmentị
- Inye iwu iji majaa ndị mmadụ ka ha ghara ịpụta iro n'ụbọchị Mọnde, abalị iri atọ na otu nke ọnwa Mee 2021
- Ịgbasa ozi ebe ọ nọ kpọkuo ndị mmadụ ka ha malite ịkpa aghara iji chụtuo gọọmentị (violent revolution)
- Ịgbasa ozi ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha mebie ma gbaa ụlọ gọọmentị ọbụla ọkụ na Legọs, nke a kpatara e ji bibie ọtụtụ ihe gọọmentị nwe na Legọs.
- Ịgbasa ozi ma gwa ndị mmadụ ka ha mebie ugbọala njem niile nke gọọmentị Legọs nwe, nke a buteere nnukwu ịla n'iyi nakwa ọghọm nye gọọmentị Legọs steeti
- Nnamdi Kanu bubatara akụrụngwa mgbasaozi a kpọrọ 'radio transmitter - Tram 50L' ma debe ya n'obodo Ubuluisiuzor nke dị n'okpuru ọchịchị Ihiala
Ebubo ndị nke a kụchapụrụ na ndị nke ka na-aga n'ihu

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome (SAN) na Ifeanyi Ejiofor gwara ọkaikpe Binta Nyako na aka Kanu dị ọcha, ma rịọ ya ka ọ kụchapụ ebubo niile a.
Mana ọkaikpe Nyako kụchapụrụ naanị asatọ n'ime ebubo iri na ise ahụ, ma hapụ asaa ka Mazi Kanu zara ọnụ ya maka ha.
Ebubo ndị ọkaikpe Nyako kụchapụrụ bụ ebubo nke isii, asaa, asatọ, itoolu, iri, iri na otu, iri na abụọ, na iri na anọ.
Nke a ejughi ndị ọkaiwu Kanu afọ nke mere ka ha gbaa akwụkwọ mkpesa n'ụlọikpe mkpesa, iji rịọ ka a kụchapụ ebubo niile ahụ kpamkpam maka na "ha achịtaghị aja.
Ọ bụ ikpe a ka a na-ekpe taa n'ụlọikpe 'Court of Appeal' dị n'Abuja.









