Nnamdi Kanu court case: Lee ego Kanu chọrọ ka gọọmentị kwụọ ya maka ịnwụchi ya na mba Kenya

Ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia, Abia Steeti eyigharịala ikpe akwụkwọ onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu gbara Gọọmentị etiti n'ebubo etu ọ sị "ha jiri nwuchie ma tụọ ya mgbere" site na mba Kenya lọta Naịjirịa.
Ọkaikpe ji ikpe a bụ Evelyn Anyadike yigharịrị ikpe ahụ ka ọ bụrụzie n'ụbọchị 12 Mee afọ 2022.
Gịnị mere e ji yigharịa ikpe a

Mgbe mbụ e tinyere ọnụ n'ikpe a n'ụbọchị 25 Maachi, 2022 ọkaipe gwara ndị okaiwu Kanu na nke gọọmentị ka ha mara ma e kwesiri ikpe ya na Naịjirịa maka na ọ bụ ihe mere na Kenya.
Ọ gwara ha dee akwụkwọ banyere nke a ma wete n'ụlọikpe n'ụbọchị 27 Eprel 2022.
Mana mgbe a kpọpụtara ya n'ụlọikpe, ya bụrụ na ndị ọkaiwu gọọmentị Naịjirịa edeghi akwụkwọ nkọwa ahụ ọkaikpe sị ha dee.

Nke a mere onye ndu ndị ọkaiwu gọọmentị bụ Amos Enoch jiri rịọ ka e nyekwuo ha ohere ide akwụkwọ nkọwa ahụ.
Ọkaikpe Anyadike gere ntị n'arịrịọ ha ma yigharịa ikpe ahụ n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee afọ 2022.
Kedụ ihe Kanu chọrọ ka ụlọikpe mee?

N'akwụkwọ a nke ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy ejimakor gbara, ọ chọrọ ka ụlọikpe mee ihe ndị a;
- Inye Kanu ikike ruru ya bụ nke ọ sị gọọmentị metọrọ site n'inwuchi ya na mba Kenya, ịta ya ahụhụ nakwa ịkpọlata ya na Naịjirịa n'ụzọ na-ezighi ezi a kpọrọ 'extraordinary rendition'.
- Ka ụlọikpe kwụsị ikpe gọọmentị Naịjirịa na-ekpe Kanu nke ọ sị na o zighi ozi ma kpọghachị ya na mba Briten o bi.
- Ọ sị ka ụlọikpe nye gọomentị iwu ka ha kwụọ Kanu ego dị ijeri naịra iri abụọ na ise (N25bn) ma rịọ ya mgbaghara n'ihu ọha.
Ndị ọrụ nchekwa dịka ndịagha ji ụgbọala ha nọrọ n'ihu ụlọikpe a ebe ndị uweojii nzuzo bụ Department of State Services (DSS) nọkwa n'ụlọikpe a.
A na-atụ anya na ọ ga-ebiri ọkụ n'elekere asatọ nke ụtụtụ ebe ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor ga-ekwuchitere ya ọnụ.
Gịnị mere ikpe nke a jiri dị iche n'ikpe anị ọzọ?
Ikpe dị n'etiti Nnamdi Kanu na Gọọmentị Naịjirịa abụghị karịrị otu, ha niile nwere isiokwu ebe a gbakwasịrị ụkwụ na-ekpe ya.
Ihe mere nke a ji dị iche n'ikpe ndị ọzọ gụnyere;
- Ọ bụ Kanu gbara Gọọmentị Naịjirịa akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia, Abia Steetị site n'aka ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor.
- Ọ na-eleba anya n'etu Gọọmentị Naịjirịa si 'tọọrọ' Kanu n'ike site na mba Kenya lọta Naịjirịa.
- O metụtara ebubo mmetọ ikike dịịrị onye nke Kanu na-ebo Gọọmentị Naịjirịa
Ikpe ndị ọzọ dị n'etiti ha gụnyere; nke Gọọmentị Naịjirịa kpụpuru Nnamdi Kanu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja make ebubo ruru iri na ise bụ nke ọkaipe Binta Nyako akachapụla asatọ n'ime ha.
Nke ọzọ bụ akwụkwọ Kanu gbara gọọmentị Naịjirịa n'ụlọikpe Abia Steetị maka ebubo ha zipuru ndịagha ka ha wakpo ụlọ ya dị n'Afara Ukwu Umuahia n'ike n'afọ 2017.
Ụlọikpe chabiri ikpe a ma sị ka Gọọmentị Naịjirịa kwụọ Kanu otu ijeri naịra, bipụta akwụkwọ arịrịọ mgbaghara n'ihu akwụkwọ ntaakụkọ na Naịjirịa.
Ikpe ọzọ bụ nke Kanu gbara Gọọmentị Naịjirịa na Gọọmentị Kenya n'ụlọikpe mbaụwa maka ịkpọlata ya n'ike site na Kenya.
Bruce Fein bụ ọkaiwu Kanu n'Amerịka na-anọchite anya ya n'ikpe ahụ, mana mba Kenya ekwuola ọtụtụ mgbe na aka ha dị ọcha n'ebubo a.








