Bruce Fein Ipob Lawyer: Lee ebe ọ sị ọ ga-ebu ikpe Nnamdi Kanu aga

Ebe foto si, BBC/Ejiofor
Bruce Fein ekwuola na dịka ọkaiwu nakwa onye na-ekwuchitere ọnụ Nnamdi Kanu na mba ofesi ugbua, na ọ ga-aga ngalaba dị iche iche na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ na mba ụwa niile iji wee hụụ na e nyere Kanu ikpe kwụ ọtọ ma soro ụzọ iwu kwadoro kpe ya ikpe.
N'okwu ya, nke mbụ m ga-aga bụ "International working group on arbitrary detention" na-enwe ọgbakọ na Geneva, nke bụ mgbakwụnye "United Nations human rights Council."
Nke abụọ bụ "International Criminal Court of Justice,International Criminal Court"na-anabata ebubo mpụ metụtara mwakpo ikike diri onye nke megidere nkwekọrịta gbasara igbuchapụ agbụrụ."
Nke atọ bụ "United Nations Security Council"nke o kwuru hiberela ọtụtụ ụlọikpe makana ha na-eche na ụlọikpe ime ụlọ etozughị oke ikpe ikpe gbasara mgbuchapụ agbụrụ.
Fein kwuru na o chetara mgbe ngalaba a hibere ụlọikpe pụrụiche maka ikpe onyeisala Serbia bụ Slobodan Milošević maka ikpochapụ agburu o mere mgbe alụrụ agha Serbia.
Nke anọ bụ United States congress: Fein kwuru na ọ bụ ebumnobi mba Amerịka bụ ịhụ na e nwere ezi ikpe na ọchịchị onye kwuo uche ya tọrọ atọ, nnabata okpukperechi onye na Naịjirịa.
N'okwu ya, "cheta na e kwuru ka etinye aha Naịjirịa n'ogo mba kachasị enwe nsogbu imegide ndị okpukperechị ụka Christ nke gụnyere ọtụtụ ndị Biafra."
"Ebumnuche anyị bụ iji ngalaba mba ofesi ndị a gosi na ihe ọbụla gbasara ikpe Nnamdi Kanu agaghị abụ nke e kpuchiri ekpuchi." Dịka Fein si kwu.
Onye bụ Bruce Fein, ọkaiwu Nnamdi Kanu a si mba Amerịka?

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor
Onye ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor sị na ndị ọrụ nchekwa DSS ekweghi ha hụ Kanu mgbe ha gara ileta ya n'ụbọchị Tọọzde.
Ejiofor sị na ya Bruce Fein bụ ọkaiwu Nnamdi na mba Amerịka so mee njem ahụ dịka nwamadị a batara Naịjirịa n'izu a.
Nke a butere ọtụtụ nkatọ nye ndị DSS dịka ọtụtụ na-ajụ "kedụ onye nwamadị Bruce Fein a bụ?"
Ihe i kwesịrị ịma maka Bruce Fein

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor
- Bruce Fein bụ nwafọ mba Amerịka, a mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Maachị, afọ 1947.
- Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na Swarthmore College, gụọ na mahadum California nakwa ụlọakwụkwọ Havard bụ ebe ọ mụrụ banyere ọkaiwu.
- Ọ lụrụ nwunye ya bụ Mattie Lolavar n'ụbọchị 15 nke ọnwa Mee, afọ 2004 mana ha gbasara n'ọnwa Juun afọ 2013.
- Bruce bụ ọkaiwu gbakwasịrị ụkwụ n'ikpekaarị ikpe metụtara iwu banyere mba ndị ọzọ a kpọrọ 'International law'
- Ọ bụ otu n'ime ndị osote ọkaiwu ukwu mba Amerịka mgbe Ronald Reagan bụ onyeisiala mba ahụ.
- Ọ rụọla ọrụ n'ụlọọrụ 'American Enterprise Institute', 'Heritage Foundation', 'Conservative think tanks' na ndị ọzọ.
- Fein edeela akwụkwọ dị iche iche banyere ime iwu nakwa nsogbu metụtara ya.
- Ugbua Fein bụ ọkaiwu na-ekpere onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu ikpe n'okwu metụtara iwu na mbaụwa dị iche iche.









