Nnamdi Kanu Arrest: 'Ịga a tụrụ Nnamdi Kanu n'aka bụ Igbo niile ka a tụrụ ya' - Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Nigeria Presidency-Facebook
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ya bụ ịga a tụrụ Nnamdị kanu bụ Igbo niile ka atụrụ ya.
Ọ kawara Igbo niile nọ n'ụzọ na nke nọ n'ama, onye mara ihe ọ ga-eme ka Nnamdị Kalu sị na mkpọrọ DSS pụta, ya mewa ya.
Ejiofor sị na "ihe mere Nnamdị Kanu mere Igbo niile."
Ọ sị na ihe kacha mkpa ugbua bụ ihe a ga-eme ka Nnamdị Kanu pụta na mkpọrọ.

Ebe foto si, Ifeanyi Ejofor
O kwukwara na ndị dị iche iche na-agba gọọmentị Naịjirịa akwụkwọ mana ụlọ mana ofesi.
Ozi Nnamdi Kanu sịrị m zie ụmụ Biafra mgbe m hụrụ ya - Ifeanyi Ejiofor
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ahụla ya n'ụlọọrụ ndị DSS dị n'Abuja dịka ụlọikpe si nye iwu.
Ejiofor sị na Nnamdi Kanu kwụ chịm na ewezuga nsogbu ịnọ n'otu ebe dịka onye e ji eji nakwa etu o si metụta ụche ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ sị na-agbanyeghi na ụlọọrụ na-elekọta ahụike ya anya mana ekwesịrị inye ya ezi nlekọta ahụike.
Ejiofor sị "ọ gwara m ka m kelee ndị nkwado ya n'ụwa niile, gọọmentị mba niile nakwa ndị ntaakụkọ na-eso ihe banyere nwuchi na ikpe m".
Ọ sị na ha ga-enwe mmeri kama na ha chọrọ ekpere, ka onye ọbụla adaala mba dịka ha na-erubeisi n'iwu na-achị obodo.
Ejiofor sị na ha ga na-ewete ozi ka ihe banyere ọnọdụ nakwa ikpe Nnamdi Kanu si aga karịsịa ugbua ha na-enwe ohere ị na-eleta ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị












