Nnamdi Kanu: Ihe mere mgbe anyị gara n'ụlọọrụ DSS ịhụ ya - Ejiofor

Ifeanyi Ejiofor, ọkaiwu Nnamdi Kanu

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu akọwaala ihe ha gabigara n'aka ndị uweojii nzuzo bụ DSS n'ịchafụ mgbe ha gara ịhụ Kanu n'ụbọchị 29 Julaị, 2021.

Ọ sị na mgbe ha ruru ebe ahụ ịhụ Kanu dịka ụlọikpe ji nye ikike na ndị ọrụ DSS sị ha natara ozi ikike ụlọikpe nyere mana jụụ inye ha ohere.

Ha sịrị ha depụta aha mmadụ ole ga-ahụ Kanu bụ nke mere depụtara nye ndị DSS.

Ejiofor sị dịka ha nọ ebe ahụ na-eche, na ndị ọrụ DSS bịara sị ha lawa gaa chere mgbe a ga-akpọ ma elebachaa anya n'akwụkwọ ha wetara.

Ọ gaara n'ihu gbakwụnye akwụkwọ ikike ahụ ụlọikpe nyere ha ịhụ Kanu n'ụbọchị 26 Julaị, 2021.

Akwụkwọ ikike e nyere ka ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu hụụ ya anya

Ebe foto si, Ọkaiwu Ejiofor

Ejiofor sị na agwa a ndị DSS kpara ejughi ya anya maka na ha dị mbụ na-enupuisi n'iwu ụlọikpe nyere.

Ọ sị na ụjọ ya bụ na ọ maghị etu ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu dị ugbua na ọ chọrọ ka ụwa mata nke ahụ.

Ọ gaara n'ihu kwuo na ihe ọbụla mere Kanu na ọ bụ gọọmentị Naịjirịa na DSS ga-aza ajụjụ ya.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Ndị aka ha dị na nwuchigharị ya ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor